Ịgụ Aha n’Ala Igbo
Ịgụ Aha n’ala Igbo pụtara inye mmadụ, ọ kachasị nwata a mụrụ ọhụụ ahà, ma ọ bụ ịbà ahà, dịka ndị si asụ. Aha bụ njirimara onye ma bụrụkwa ihe onye na-aza. Onye ọbụla na ihe ọbụla dị n’ụwa nwere aha e jiri mara ya, ma ndị nwụrụ anwụ ma ndị dị ndụ; maka na onye enweghị aha nọ ọdụ ka oke osisi enweghị akwụkwọ. Ọbụnadị ụmụaka a mụrụ ọhụụ […]