A Kpọkuola Ndị Anambra Ka Ha Na-Edobe Ọwà Mmiri Ha Ọcha

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor

Ọ na-adị mma ịma ọkwa mmiri tupu ozuzo ya, ma na-akakwa mma iji ehihie wee chụba ewu ojii, maka na chi jie ọ hịa ahụ njide.Ọ bụ n’ịgbaso nke a ka gọọmenti steeti Anambra jiri kpọọ òkù ọzọ ma dụọ ụmụafọ steeti ahụ ọdụ ka ha na-edebe ọwà mmiri ha ọcha, ma kwụsị iji unyi, atịtị na ihe ndị ọzọ dị etu ahụ were na-emetọ maọbụ na-asụchisi ọwà ọwà mmiri […]

Ndị Ihiala Ejirile Ọñụ Rie Ji Ọhụrụ

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor, Mmemme

Oke ọñụ dara na nsonso a n’obodo Ihiala dị n’okpuru ọchịchị steeti Anambra, dịka ndị obodo ahụ merùbèrè mmemme iri ji ọhụụ ha nke ahọ 2020.Mmemme Ịwa Ji ahụ e mere n’obi eze ọdịnala obodo ahụ bụ Igwe Thomas Ikenna Obidiegwu dọtàrà ụmụafọ obodo ahụ nọgasị n’ebe dị iche iche, ndị ikwu na ibe, ndị nwadiala, ndị enyi, ndị agbatobi na ndị ọzọ na-echère obodo ahụ ezi echichè.N’okwu ya oge […]

Onye Omeiwu Anambra, Ọzọbịalụ Amalitela Ịrụ Ụlọ Ahụike n’Ogbodi, Amichi

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a, dịka onye omeiwu ahụ na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo ‘Nnewi South’ nke mbụ n’ụlọ omeiwu steeti Anambra, bụ Maazị Sonny Ozobịalụ malitere ịrụ ụlọ ahụike n’Ogbodi, dị n’Amichi,  n’okpuru ọchịchị ‘Nnewi South’ steeti Anambra. N’okwu ya na mmemme ahụ, ya bụ onye omeiwu mèrè ka a mara na ịrụ ụlọ ahụike ahụ so n’otù n’ime nkwà o kwèrè oge ọ na-achụ […]

Gọọmenti Anambra Agbapeela Akụrụngwa Ọhụrụ n’Ụlọọgwụ Enugwu-Ukwu

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor

N’ịgbaso nke a, gọọmenti steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee gbapee ọmarịcha akụrụngwa ahụike ọhụụ (bụ ‘Ultrasound Machine’) na akụrụngwa e ji esi n’ike anyanwụ adọta ọkụ (bụ ‘Solar Energy System’) e butèrè n’ụlọ ahụike ọhaneze dị n’Enugwu-Ukwu, dị n’okpuru ọchịchị Njikọka.Akụrụngwa ọhụụ niile ahụ bụ nke a gbapèrè site n’aka osote Gọvanọ steeti ahụ, bụ Dọkịta Nkem Okeke. N’okwu ya oge ọ na-agbape akụrụngwa ahụ, Dọkịta Okeke mèrè […]

Ọñụ Adaa Dịka Gọọmenti Anambra Gbàpèrè Ụzọ Ọhụụ n’Onneh

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor

Oke ọñụ dàrà na nsonso a n’obodo Onneh dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Orumba South’ nke steeti Anambra, dịka gọọmenti steeti ahụ gbàpèrè ọmarịcha okporo ụzọ ọhụụ n’obodo ahụ. Ya bụ okporo ụzọ ọhụụ bụ nke a rụrụ site n’aka otu nwa amadi ọrụ obi ebere na-echu ụra n’obodo ahụ, bụ Maazị Vincent Nwanko, ma bụrụkwa nke ọ rụchaara ma chọọ ya mma nke ukwuu.Mmemme ịgbape ụzọ ahụ bụ nke  […]

Ndị Nteje Emee Ịlọ Mmụọ Nke Ahọ 2020

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor

Igbo sị na omenala bụ ọbara n’ehu n’agbụrụ n’agbụrụ, ma bụrụkwa nwata tote o tokwuru.Ka ọ dị taa, ndị obodo Nteje Abọgụ, dị n’okpuru ọchịchị Oyi n’ime steeti Anambra emeela mmemme Ịlọ Mmụọ, bụ otu oke mmemme e jiri mara ya bụ obodo, ma bụrụkwa mmemme ịwa na iri ji ọhụụ nke eze ọdịnala obodo ahụ.Oke mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’obi eze ọdịnala obodo Nteje, ma bụrụ nke […]

Achbishọọpụ Okeke Arụọrọla Onye Ikedịnobi Ụlọ Ọhụụ Na Nteje

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor

Igbo sị na omere onye ogbenye na-emere chi ya, ma sịkwa na ọ hụrụ mma mee nwèrè ụgwọ ọrụ.N’ịgbaso nke a, Achbishọọpụ ụka katọliiki na mpaghara Ọnịtsha, bụ Achbishọọpụ Valerian Okeke nọrọ na nsonso a wee rụọrọ ma nyefèé ọmarịcha ụlọ ọhụụ n’aka otu nwata nwaanyị bụ onye ikedịnobi (nke ụfọdụ maara dịka ndị ọlụsị maọbụ ndị nwere nkwarụ) n’Ụmụazụ Nteje dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Oyi nke steeti Anambra.Mmemme […]

Ndị Owerre-Ezukala Eriela Ji Ọhụụ

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor

Ji bụ eze ihe a kọrọ n’ubì, bụzị nke mere nfị Igbo n’ụwa gbaa gburugburu ji akwanyere ya ùgwù.Ọ bụ n’ịgbaso ya bụ omenala dịbara gboo ka ndị obodo Owerre-Ezukala jiri nọrọ na nsonso a wee merùbe mmemme iri ji ọhụụ nke ha, nke ahọ 2020.Ya bụ oke mmemme wèèrè ọnọdụ n’eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Timothy Ogbonnaya dị n’Ishishi Owerre-Ezukala n’okpuru ọchịchị ‘Orumba South’ nke steeti Anambra, ma […]

Njekoro: Ndị Anambra Bi Michigan, U.S.A. Ebunyela Gọọmenti Akụrụngwa Nchekwa Ahụike

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor

Òtù jikọtara ụmụafọ steeti Anambra bi na mpaghara Michigan nke mbà U.S.A ebunyela gọọmenti steeti Anambra akụrụngwa nchekwa ahụike nà ngwaọrụ dị iche iche dịka nkwàdo na enyemaka nke ha n’agha ahụ a na-ebu megide ọrịa nje korona n’ime steeti ahụ.Akụrụngwa ha butere gụnyèrè ihe ndị ọrụ ahụike ji eyichi ahụ ma ha nọrọ n’ihu ọrụ , ma bụrụkwa nke a ga-ekesàra ụlọ ahụike dị iche iche dịgasị na steeti […]

Ọba Akwụkwọ Emeela Ụbọchị Mmụta Na Mba Ụwa

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor

A kọwaala agụmakwụkwọ dịka onyinye kacha mma mmadụ kwesiri inye nwatakịrị ọbụla; ma mekwa ka a mara na ọnụọgụgụ ụmụaka anaghị agụ akwụkwọ taa na Nigeria gafèrè ndè iri na atọ.Nke a bụ nke e kwupụtara site n’ọnụ  onyeisi isingalaba ọmụmụ ihe ‘Social Sciences’ nke mahadum Nnamdị Azikiwe dị n’Awka, bụ Ọkammụta Stella Ọkụnna, n’okwu ya na mmemme ncheta ụbọchị mmụta na mba ụwa nke ahọ 2020, bụ nke a […]