Etu Anyị Siri Malite
Ụwandiigbo malitere nʻỌgọọsịtị 21, 2000. Na mbido ya, ndị Ụwandịigbo ji ozi ikuku imeelu ezigara onwe ha ozi. Onyeisi Ụwandịigbo bu Omenka Ejike Eze ji ozi ikuku ahụ were na-akuzi Igbo nʻefu. Ụfọdụ ndị sonyere ozigbo Ụwandiigbo malitere bụ mmadụ dịka Moe Ene, Iwu Ikwubuzo, Chiji Akọma, Chinyeaka Okoli, Carolyn Watson na Franches Pritchette (Nkiru), onye larala mmụọ. Mgbe ngwaese Whatsapp pụtara, mkparịtaụka nʻỤwandiigbo cheziri ihu na ya bụ ngwa ọbịaraọhụrụ.
Mbunuche Ụwandiigbo
Mbunuche Ụwandịigbo bụ ịkwalite asụsụ na omenala Igbo. Kwa afọ, Ụwandịigbo na-ewepụta mbụnuche ya maka afọ a nọ na ya. Nke a bụ ụfọdụ mbunuche nke afọ 2020:
1. Kwa ọnwa, anyị ga-ewepụta isiokwu abụọ anyị ga-elebanye anya na ha.
2. Onye ọbụla nwere ike ga-etinye ọnụ nʻokwu ndị anyị na-atule.
3. Na ngwụcha ọnwa, otu onye ga-ekpokọtara anyị ihe anyị kpaputara nʻisiokwu abụọ ndị ahụ.
4. Nʻọnwa Nọvemba, Ụwandịigbo ga-achọkọba ọgbakọ zuzugbe nʻasụsụ Igbo. Jee ebe a gụọ maka ya.
Isi Sekpụ Ntị nʻỤwandịigbo
Ndị a bụ ndị na-achịkọta ihe a na-eme nʻỤwandịigbo.

Omenka Ejike Eze bụ onye malitere Ụwandịigbo. Ọmenka mụrụ ihe gbasra asụsụ Igbo nakwa Linuistics ruo nzere Ph.D.

MO Ene (Egbedaa IV) bụ onyenkuzi Mahadum na Seton Hall na New Jersey nke dị nʻAmerika. Ọ gụrụ ihe gbasara nkanaụzụ ruo nzere Ph.D.

Ọkammụta Iwu Ikwubuzo bụ onyenkuzi Igbo na Mahadum Legọọsị. Iwu gụrụ ihe gbasara asụsụ na agụmagụ ruo nzere Ph.D.
Ndị Ọzọ
O nwere ọtụtụ ndị ọzọ so nʻỤwandịigbo nke anyị agaghị enwe ike idepụtacha aha ha ebe a.