Ịlụ Nwaanyị n’Ala Igbo: Oge Mbụ Na Oge Ugbu a

Posted Leave a commentPosted in Izunna Okafor, Mmemme

Ịlụ nwaanyị bụ ọzọ dịịrị okokporo niile, ma bụrụkwa a na-agụrụ akwụ nwanne ya a na-éghè.Ọ bụ ụkwa ruo oge ya, ọ daa. Ịlụ nwaanyị bụ okokporo rie ọ lakpuo n’ihi na ọ bụ òkè ọhà, onye kere nke ya, ọ lakpuo be ya, ga ribe.N’ihi na a sị na ihe mmadụ ruru ogo ya wee rie, ọ bụghị akpịrị, ịlụ nwaanyị bụ omenala zuru ụwa ọnụ. Ya bụ, ndị […]

IGP Adamu Ètòólá Anambra Maka Ezi Ọnọdụ Nchekwa

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor

Onyeisi ndị uweojii n’ala Nigeria, bụ IGP Mohammed Adamu ètòóla ọchịchị steeti Anambra maka ọrụ ya n’ịkwalitè ezi ọnọdụ nchekwa bụ ịgbà na steeti ahụ, nke mezịrị ka ya bụ steeti bụrụ ejiamaatụ na ebe nlegara anya n’ihe gbasaara nchekwa n’ala Nigeria.IGP Adamu kwupụtara ekele a na nnukwu ọgbakọ ya na ndịisi oche nchereoge n’ime steeti ahụ, ndị eze ọdịnala, ndị ndu obodo, ndị ndu òtù ASATU, ndị ndu ndị […]

Ọba Akwụkwọ Anambra Emeela Ụbọchị Ncheta Asụsụ Ọdịnala na Mba Ụwa

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor

A kpọkuola ụmụakwụkwọ, ndị nkuzi na nne na nna bụ ndị Igbo ka ha jiri asụsụ Igbo wee na-ekwurịta okwu n’ụlọakwụkwọ na n’ezinụlọ ha dị iche iche, ma n’ala Igbo ma na mpaghara ebe ndị ọzọ.Onyeisi ọba akwụkwọ Steeti Anambra (bụkwa Ọba Akwụkwọ Ọkammụta Kenneth Dike) dị n’Ọka (Awka) bụ Dọkịta Nkechi Udeze kpọrọ òkù ma nye ndụmọdụ a n’okwu ya mgbe ya na ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi ụlọakwụkwọ dị […]

Nne Chimamanda Adichie Anwuola

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor

Ka ọ gachara ihe dịka ọnwa ise o jiri kwachaa nna ya, ihe mgbu ọzọ dakwasara Chimamanda Adịchie, bụ ode akwụkwọ na-ewu ewu na mba ụwa, dịka nne ya bụ Oriakụ Grace Ifeoma Adịchie nwụkwàrà.Ya bụ nwaanyị gbara ahọ iri asaa na asatọ ka e kwuru na ọ nwụrụ n’Ọka (Awka) bụ isi obodo steeti Anambra ụbọchị Mọnde, abalị mbụ nke ọnwa Maachi ahọ a, bụkwa ụbọchị ncheta ọmụmụ di […]