What We Do

 

Ịkwalite Asụsụ na Omenala Igbo

Ụwandiigbo bụ otu na-akwalite asụsụ na omenala Igbo. Ihe niile ndị Ụwandịigbo na-ede bụ nʻasụsụ Igbo. O nweghi nke a na-ede na Bekee. Ndị niile nọ nʻỤwandịigbo bụ ndị aka kara aka nʻedemede Igbo.

Ime Ka Mba Ụwa Niile Mara maka Igbo

Ạnyị na-agba mbọ ịhụ na ụwa niile maara maka asụsụ Igbo nʻihi na o nweghi asụsụ dị ka Igbo. Ụzọ anyị si eme nke a bụ site nʻidepụta akwụkwọ dị iche iche, ma iduuazi, ma ejije nakwa abụ. Anyị na-edekwe edemede nʻama sayịba dị iche iche tinyere nke a bụ Ụwandịigbo.org.

Ikuziri Ụmuigbo A Mụrụ nʻOfesi Asụsụ Igbo

Nwata na-asụ nri ji.
Nwata a na-akuzir ite ofe
Nwata na-asụ nri ji
Ụmụaka na-abacha ji a ga-asụ ụtara.
Ọ bụrụ na Igbo ga-eto ma gbaa mgbọrọgwụ, ụmụaka Igbo ga-amalite sụwa asụsụ Igbo karia ka ha si asụ Bekee. Nke a mere anyị jiri wepụta oge iji na-akuziri ụmụaka a mụrụ nʻebe abụghị ala Igbo, nakwa ndụ a mụrụ nʻala Igbo, asụsụ ha.

Ị chọrọ ka ụmụ gị sụwa Igbo?

Ngwa, were ọsọ, were ije gaa denye aha nʻụlọakwụkwọ ebe a na-akuzi Igbo. Ụfọdụ ụlọakwụkwọ ndị a ahụ bụ ndị a:
Ụmụaka PILA
   

Leave a Reply