Resources

Ebe a, anyị ga-etinye ọtụtụ ihe ọmụmụ nke anyị mere nʻỤwandịigbo. Ọ
buru na ị chọrọ isoro anyị na-akparịta ụka na NgwaEse Whatsapp,  pịa aka ebe a ka ị bata nʻotu Ụwandịigbo.

 

                                                                                      Etu E Si Ede “Na” n’Edemede Igbo

                                                                                                                       Si nʻAka

                                                                                                    Omenka Ejike Eze

E nwere ọrụ anọ na na-arụ nʻasụsụ Igbo:

  1. “Na” dịka Njiko (“Na” as conjunction)
  2. “Na” dịka Nnyemaka Ngwaa (Na as auxiliary verb)
  3. “Na” dịka Mbuuzọ (“Na” as preposition)
  4. “Na” dịka Nkwado (“Na” as complementizer)

“Na” Dịka Njiko (Na as Conjunction)

“Na” na-arụ orụ ijikọta okwu, (words), nkebiokwu (phrases) na nkebiahịrị (clauses). Mgbe “na” na-arụ Ụdịrị ọrụ a, ọ na-akwụrụ onwe ya.

Ọmụmaatụ:

  1. Obi na Ada jere akwụkwọ (Obi and Ada went to school)
  2. Onye toro ogologo na onye dị mkpụmkpụ etosighị ịlụ ọgụ (A tall person and a short person should not fight).

“Na” Dịka Nnyemaka Ngwaa (Na as Auxiliary Verb)

Mgbe “na” bụ nnyemaka ngwaa, a na-eji akarauhie (dash) gbakwụnyere ya okwu ngwaa ọ na-enyere aka.

Ọmụmaatụ:

  1. Nneka na-ede Igbo nke oma (Nneka writes/is writing Igbo well)
  2. Anyị na-ele ihe ụbọchị ga-eweta (We are watching what the day will bring)
  3. Odoziakụ Okoye na-akuziri ụmụaka Igbo (Mrs. Okoye teaches/is teaching Igbo to the children)

“Na” Dịka Mbuuzọ (“Na” as Preposition)

Mgbe “na” na-arụ ọrụ dịka mbuụzọ, etu e si ede ya dị ụzọ abụọ. Ọ bụrụ na okwu na-eso ya malitere na mgbochiume (consonant), “na” na-akwụrụ onwe ya.

Ọmụmaatu:

  1. Aririerimba gụrụ akwụkwọ na Nsụka. (Aririerimba studied at Nsụka)
  2. Ndịigbo nọ na nsogbu. (The Igbo are in trouble)

 

Mgbe okwu na-eso “na” malitere nʻụdaume (vowel), a na-eji rikọm elu (apostrophe) anọchi adị na “na”.

Ọmụmaatụ:

  1. Ihe adịghị mma nʻAla Igbo. (Things are not good in Igbo Land)
  2. Eze kpọrọ anyị oku nʻụlọ ya (Eze invited us to his house)

“Na” Dịka Nkwado (“Na” as complementizer)

Mgbe na na-arụ ọrụ dịka nkwado, ọ na-akwụrụ onwe ya.

Ọmụmaatụ:

  1. Obi dị m mma na m hụrụ gị (I am happy that I saw you)
  2. Mmadụ niile maara na Igbo bụ oke asụsụ (Everyone knows that Igbo is a great language)

 

 

Nnọchiaha nʻAsụsụ Igbo – Pronouns in Igbo Language

Si nʻaka Ejke Eze (Omenka)

Dịka aha ya siri dị, nnọchiaha bụ okwu na-anọchi anya (mkpọ)aha na nkebiokwu nakwa ahịrịokwu. Ịmata nnọchiaha Igbo nakwa etu e si ede ha dị nnukwu mkpa nʻedemede Igbo.

Mgbe ọbụla nnọchiaha pụtara nʻedemede Igbo, ọ na-akwụrụ onwe ya. A naghị edeko ya na okwu ndị ọzọ.

Ndị a bụ nnọchiaha ndị e nwere nʻasụsụ Igbo:

 

Nnọchiaha Nge (Singular Pronoun)

M/Mụ (1)

Ọmụmaatụ: M jere ahịa

M (me)

Ọmụmaatụ: Egbedaa nyere m akwụkwọ

I/Ị (You)

Ọmụmaatụ: I riri ji (you ate yam), tara akị (You ate palm kernel)

Gị (You)

Ọmụmaatụ: Chiji hụrụ gị.

O/Ọ (He, She, It)

Ọmụmaatụ: O riri ji (He/She ate yam), tara ọka (He/She ate corn)

Ya (Him/Her)

Ọmụmaatụ: Chike nyere ya ego (Chike gave him/her money)

A/E (Someone/Something)

Ọmụmaatụ: A gbaara ha ama (Someone tipped them off). E nyere ya ego (Someone gave him/her money)

 

Nnọchiaha Mkpị (Plural Pronouns)

 

Anyị (We)

Ọmụmaatụ: Any na-asụ Igbo (We speak Igbo)

Unu (You)

Ọmụmaatụ: Unu maara onwe unu (You know each other)

Ha (They)

Ọmụmaatụ: Ha emebiele omenala anyị (They have destroyed our culture)

Okwu Mmechi:

Biko jee nʻAmazon zụrụ akwụkwọ a kpọrọ Mụta Igbo nʻOtu Onwa (Master Igbo in One Month) nke Iwu Ikwubuzo na Ejike Eze dere. Ọ ga-enyere gị aka ịmụta asụsụ Igbo.

Maka Ndị Batara Ọhụrụ

Nnọọ nʻỤwandịigbo, òtu na-akwalite asụsụ na omenala Igbo. Ọ bụrụ na i mebeghi nke a, biko kọwaara ndị Ụwandịigbo onwe gị – aha gị, aha obodo gị, ebe i bi na ebe ị na-arụ ọrụ. Biko gụọ Iwu Jikọtara Òtú Ụwandịigbo nke ọma. Biko gbaa mbọ jee na www.uwandiigbo.org ka i lee ụfọdụ ihe anyị merele ebe ahụ.

Iwu Jikọtara Òtú Ụwandịigbo

Ndị a bụ iwu òtú Ụwandịigbo. Onye daa otu n’ime iwu ndị a, anyị na-ewepụ onye ahụ n’amaghị ọkwa ọbụla makana ihe ọha kara bụ iwu. E kpegbuo nwa nna ya ji akụ, e si n’ama nna ya kpụrụ ya gafee.

🔹Ụwandịigbo anaghị anabata asụsụ Bekee maọbụ asụsụ ọzọ abụghị Igbo. Ma ị na-ama ọkwa, ma ị na-ezi ozi, ma ị na-ekele ekele, ọ ga-adịrịrị n’asụsụ Igbo.

🔹Ụwandiigbo anaghị anabata mmadụ ịkparị ibe ya, ịkpọ mmadụ iyi maọbụ ikwu okwu anaghị egosi nsọpụrụ mmadụ na ibe ya. Uche bụ akpa, onye ọbụla nya nke ya.

🔹Ụwandịigbo anaghị anabata ndọrọndọrọ, ma nke Naijiria ma nke mba ọzọ. Ọrụ Ụwandịigbo bụ ịkwalite asụsụ na omenala Igbo.

🔹Ụwandịigbo anaghị anabata azụmahịa. Anyị anaghị eresi ndịahịa akara ekwentị mmadụ. Anyị achọghịkwa ka mmadụ si nʻamaozi Ụwandịigbo were akara ekwentị onye otu anyị naanị maka iresi onye ahụ ahịa maọbụ iduba onye ahụ nʻotu ọzọ.

Nnọọ.

“Were ya ka egwu”
Abụ m,
Omenka


Etu e si atụpọ mkpụrụedemede Igbo
Ngwa ọrụ anyị ji ede Igbo n’ekwentị bụ SwiftKey.

Inwete SwiftKey (To get SwiftKey) 

1. Dee SwiftKey na “Search” ekwentị gị (Apple Store maọbụ Google Play). 

2. Gaa pịa aka ná “Install” ka o butuo ya na ekwentị gị.

3. Ị ga-ahụ Open. Pịa ya aka iji mepe ya. Ihe mbụ ị ga-ahụ bụ Enable SwiftKey. Pịa ya aka ka o bute gị n’ébé ị ga-etinyezi ya na SwiftKey keyboard. 

4. Gaa na nke abụọ pịa aka na Select SwiftKey.

5. Ọ ga-ebute gị n’ebe ị ga-ahụ Add Language. Pịa aka na ya ka o bute gị ebe ị ga-ahụ All languages. Pịa aka na ya. Chọta Igbo. Pịa ya aka.

6. Sorozie ntụziaka ndị ọzọ ọ ga-enye gị. 
7. O sie ike, kpọọ Omenka n’ekwentị. 

“Were ya ka egwu” 
Abụ m, 
Omenka

Glossary of Coronavirus-Related Terms