Akụkọ Ụwa

Bịa Fara na Bịafra

M.O. ENE

 

 

Agba Mbụ

Ụfọdụ ndịmmadụ na-asị ka anyị chefuo maka Bịafra? Ka mụ jụkwaa nu-o: “Onye chefuru ebe mmiri bidoro mawa ya, ọ ga-echetekwe ebe ọ kwụsịrị ịma ya?” Mbanụ! Biafra bụ ngọzị pụrụiche na ndụ Ndiigbo nakwa nke Naịjịrịa—ma anyị chezie echiche ọfụma. Nsogbu bụ na ndị chịrị Naịjịrịa kemgbe 1970 rue taata aghọtaghị na onye vu ihe ishi ka ijiji na-eso. Ya ka ha jiri wepu agụgụala (“history”) n’ụlọakwụkwọ. Nke à wee bụrụ mmadụ ikpata nkụ ahụhụ buru bata n’ime ụlọ ya; ngwere ka nọkwa n’oriri na n’ọñụñụ!

Bịafra bụ ọsọ ndụ Ndiigbo na ndịagbataobi ha gbara maka inwereonwe ha, ọsọ iji gosi na dike emeghi ihe o ji bụrụ dike, ụmụazị ekpo ya aja. Onye sị ka a chaara ya ka o vuru ụwa n’isi, a chaara ya ma gwọọ ajụ igu nye ya ka o vuru àlà n’isi ya. Ọ’ụ kwa etu à ka mmiri siri banye n’opi ụgbọghụlụ, mere na ncha bara Naịjịrịa n’anya mana anyị nọkwa n’etiti mmiri.

N’afọ 1966 ka Ndiugwu bidoro gbuwe Ndiigbo na ndị yiri ha ka a na-egbu ọkụkọ Ekeresimesi. Ha chọkwara igbuchepu ndịagha Ndiigbo niile, site na onyesiala bụ Ọchịagha JTU Agụiyi-Ironsi gbadawa. A ka na-ekwu na ọkụkọ tinyere ọnụ, ọ chịrị ọkpá abụọ wunye n’ofe. Nke à mere na Ndiigbo kwekoritere na ikwe n’aka aghọọla njide. 

Ọtụmasịghị ọbara niile a kwafuru—nke Ndiigbo asịghị ka ha bọrọ ọbọ, ha kwetere gaa n’Aburi dị na mba Gana ka e kpezie. E kpebiri n’ihu Ọchịagha Ankrah ka a ga-esi na-ebi ọfụma na Naịjịrịa. Mgbe e chere na udo adịla, Ọchịagha Gọwọn na-achị Naịjịrịa oge ahụ kwugheriri sị na ụkwụ mmadụ aghọọla ụkwụ mmụọ! Ọ tụgharịrị kerie Naịjịrịa ụzọ irinaabụọ, n’agbanyeghi mpaghara anọ e nwere, bụkwa anọ e kwetere na ha ga-adị.

 Ya mere Ọgbakọ Ndịatụmatụ Ọwụwaanyanwụ Naịjịrịa (Eastern Nigeria Consultative Assembly) jiri bagide Ọchịagha Chukwuemeka Odumegwu-Ojukwu ka ọ kewepute mpaghara Ọwụwaanyanwụ Naịjịrịa ka ọ bụrụzịa “Biafra.” Aha à bụ nke ndị Potokiri kpọrọ ọnụanyịm (“bight”) dị n’Igboanị (Bonny).  

Bịafra abụghị maka nkewe maọbụ ntise Naịjịrịa. N’ezie, Ndiigbo karịrị mba niile bụrụ ndị ịdịnotu Naịjịrịa na-anụ ọkụ n’obi. Ka ọ dị tupu Bịafra bụkwa ka ọ dị ma ugbu à, ga-adịkwa rue mgbe ụwa ga-anyụ ka ọkụ. O nweghi ebe Ndiigbo ebighi na Naịjịrịa. Bịafra bịara mee ka Ndiigbo chịkọlata onwe ha, gosi na álá dị mma, ọ bata onyeọbụla ọfụma.

 N’ụbọchị iri-atọ n’Ọnwaise n’afọ 1997, ebidoro mụ Nchete Bịafra n’Amaerika. Mgbe ah Abụja achọghị ịnụ na a na-ekwu maka Bịafra. Mgbe ahụ, imilikiti ka na-edekwe “Biafra” n’ime akara mgbochi! Nchete à na-aga n’ihu tupu Maazị Ụwazuruike ebido MASSOB n’afọ 2000, tupurii anyị anụwa maka IPoB na Maazị Nnamdị Kanu. Echiche m abụghị ka e nwekwee Bịafra ọzọ; kama, ọ bụ ka a na-echete ndị nyere ndụ ha, ike Ndiigbo kpara, nchọpụta tekụnụzụ e nwere, nakwa ọchịchị imeobodo nke na-ewepute ọganiru n’obodo.

Taata, anyị na-echetekwe na a naghị agwa Ndiigbo, “Unu agaeme gịnị?” O nweghi ndị ga-emekwe Igbo ihe e mere ha na 1966 ka ha ghara ime ihe a ga-akọrọ ụmụụmụ. Bịafra bụ akụkọ a ga-akọ ụwatụụwa. Nkewe Naịjịrịa abụghị ihe Igbo chọrọ; ihe ha chọrọ bụ ọganiru: ndụ, ọmụmụ, akụ, udo, na ihunanya. Naanị ihe ise à ka Ndiigbo chọrọ. Ugbu à, gị bụ onye na-agụ edemede à ga-aghọta ihe Igbo ji ekwe “ISÉÉ!” ma a gọchaa ọjị.

2 thoughts on “Bịa Fara na Bịafra

    1. Eziokwu ka i kwuru nwanne m. Naanị onye hụrụ ihe isi butere na-asị isi nnọọ. Ihe a na-eme ndịigbo jọgburu onwe ya mana ọ bụ nganga ka okenye ji agbara ehi ọsọ. Anyị ga-eji amamihe zọta onwe anyị na Naịjirịa.

Leave a Reply