Akụkọ Ụwa

Bịa Fara na Bịafra (2)

M.O. ENE

Agba Abụọ

Onye sị Ndiigbo akọzịna maka Bịafra, ya soro ọkụkọ laba ụra. A ga na-echete Bịafra ma Ọnwaise gbaa mkpụrụ ụbọchị iri-atọ. Bịafara ga-adị rue mgbe ebighiebi, ihe ọ sọkwara mmadụ na mmụọ mewe! Ihe anyi ga na-ekwuzi ụbọchị nchete ndị ọzọ bụ ihe Bịafra mere anyị na ihe anyi ji ya mere. Taata, anyị ga-ebuli aha à n’elu kacha elu; ya kpọtụwa!

 

 Ndị na-ekwu na nchete Bịafra na-avọpụta ihe ọjọọ mere mgbe agha kwuru eziokwu, mana ichete ihe ọjọọ na-eme ka isi jụọ ụfọdụ mmadụ oyi, ka anyị mata na mmegbu adịghị mma. Ọ na-echetere anyị ihe niile e mere ka a nụchaara agha, na onye ji mmadụ n’àlà enweghi ebe ọ na-eje maka na ewu dile n’àlà dile n’akpụkpọ ya.

Isiokwu nchete Biafra bụ nkuzi ọ na-akụziri ndị Naịjịrịa niile. Ọ na-egosi na e jighi ọsọ agbakwu ọgụ, na ọgụ bụ ọnwụ. Bịafra abụghị maka ọnwụ; ọ bụ maka ndụ. Onye vuoro ọgụ bata na Bịafra bụ Gọwọn na ndienyi ya. Chukwuemeka nwa Odumegwu Ojukwu chọrọ udo, kpee udo, mana ndiosochiegbu achọghị ịma. Taata, Gọwọn na Ọbasanjọ na Danjụma na-atazị ịkịkịrị ézé, na-ekwugharị ihe ha kwuru maka Bịafra.

 Bịafra bụ ihe ịrịbaama nakwa agụgụala dị mkpa n’Afụrịka niile. Ọ bụzị ọdịnala dịara Naịjịrịa. Ọ’ụ alụlụala na o nweghi ọchịchị kwere ka e chete Bịafra, chete ya ọfụma. Onye a jụrụ agaghị ajụ onwe ya. Ndị na-achị n’Alaigbo ga-agba mbọ hazie ụbọchị 30 n’Ọnwaise ọbụla maka nchete Bịafra.

Bịafra bụ nke m na nke gị. Ị bụ Awụsa maọbụ Yoruba na Edo, Ijọ maọbụ Efik na Ibibio, Bịafra gbasara gị. O nweghi mba mmadụ na-anwụghịrị na Bịafra. N’agha a nụrụ, o nweghi onye meriri; anyị niile dara ya n’ihi ekweghiekwe, enweghindidi, asọmba nakwa akpọmasị. Ihe ndị à ka dịkwa n’etiti ndị Naịjịrịa taata. Ma i kweghi, ngwanụ, lee ka anya dị any. Ya bụ na ihe na-ebe tupu Bịafra ka na-ebekwe. Bịafra anwbeghi; ọ gaghị anwụkwanụ.

Ka anyị bido taata fara na Bịafra. Ka anyị were nkuzi Bịafra kuzie ihe mere na àlà adịghị mma na Naịjịrịa taata. Onyeigbo ọchịchị ruru aka, ya biko mee ka a na-echete Bịafra kwaafọ n’ụbọchị iri-atọ n’Ọnwaise. A ga na-amapụta atụmatụ ma hazie mmemme niile ka ha dị ka a chọrọ. Ọ bụghị ịnọ n’ụlọ ga-egosi ụmụụmụ anyị na ha si n’agbụrụ ndị siri ike, ndị nwere ịhụnanya, ndị amamihe, ndị na-agba mbọ, ndị hụrụ ụzọ, ndị na-eje mba binyere agbataobi ha, ndị kwenyere n’egbe bere ugo biri, nakwa na ebe onye bi ka ọ na-awachi.

Anyị na-echete Bịafra kwa afọ, obodo ga-adị mma. Obodo dị mma, ọ bata onyeọbụla; àlà adị mma. Àlà dị mma, i so kwe! Ya bụ, bịa… bịa fara na Bịafra ka àlà dị mma.

 

 

©MOE, 5.30.19

One thought on “Bịa Fara na Bịafra (2)

Leave a Reply