Akụkọ Ụwa

Enugwu Ga-Enwe Mahadum Ọzụzụ Ndịnkuzi

Gọvanọ Ugwuanyị mgbe ọ na-atọ ntọala

Ihu bụ ọhanaeze ọchị ọchị ka nwata tụtụtara tọrọ, ụbọchị Tuuzdee gara aga, mgbe Gọvanọ na-achị Steeti Enugwu bụ Maazị Ifeanyi Ugwuanyị, tọrọ ntọala iwuwe Mahadum ebe a na-azụpụta ndịnkuzi nʻEnugwu. Mgbe ọ na-atọ ntọala a, Gọvanọ Ugwuanyị sịrị na iwu ụlọakwụkwọ ukwu a so na mbunuche ya mgbe ya weere ọchịchị na steeti ahụ. O kwuru na o nweghị ihe dị ka mmụta, ma kwukwaa na ịzụpụta ndịnkuzi dị oke mkpa ka ha nwee ike na-akuziri ndụntorobịa nke ọma. Gọvanọ gara nʻihu kwuo na ọ bụghị naanị na Mahadum a ga na-azụpụta ụmụakwụkwọ nke ha, kama na ha ga-enyere ụlọakwụkwọ ndịnkuzi ndị ọzọ aka, tụmadị na Steeti Enugwu.

Gọvanọ Ugwuanyị

Gọvanọ Ugwuanyị toro ndị obodo Ihe nakwa ndị okpuruọchịchị Ọgwụ maka nkwado ha niile gbasara Mahadum a.

 

Nke a bụ izizi a na-ewu ụdịrị mahadum a na mpaghara ọnwụnwaanyanwụ Naijiria. Mahadum a ga na-enye nzere digirii maka ndị gụchara akwụkwọ.

Leave a Reply