Akụkọ Ụwa

Ndịntorobịa Ọhaneze Adọọla Ndị Awụsa Na-Achị Ehi Aka na Ntị

Ndị Gọvanọ Na-Achị Ndịda Ọnwụwaanyanwụ

Ndịntorobịa Ọhanaeze Ndigbo ekwuole na agwọ nʻakịrịka gbasara ihe ndị omekome na-achị ehi na-eme nʻala Igbo. Ndị a sịrị na ha bụ ndị na-achị ehi eforole ntutu taa, were na-achọ ka ha kpochapụ ụmụigbo na be nke ha.

Ndịntorobịa kpọkụru ndị na-achị achị, na steeti ise mebere alaigbo tinyere ndị ogbo ha na steeti Delta na mba mmiri ka ha nyere aka kechie ma chekwebe ala igbo ka ndị osochiegbu a ghara ịbatakwa.

Nʻokwu onyeisi otu a bụ Maazị Uchenna Obiora kwuru, ha kpọrọ ndị uweojii nakwa ndị niile na-edowe iwu ka ha gbatara ndịigbo ọsọ enyemaka tupu ndị Fulani a ekpochapụ ụmụmmadụ nʻala Igbo. Ha sịrị na ụjọ anakwaghị ekwe ndị mmadụ jee ugbo maọbụ kọnye ihe ọbụla nʻala.

Mgbe ọ na-ekwu okwu, Maazị Obiora kpọkụru ndịigbo, ma ndị bị nʻala igbo ma ndị bi mba ofesi, ka ha jikọọ aka ọnụ soro kwụsị akparamagwa ọjọọ ndị Awụsa a maka na a gbaghịrị ụzọ owere mgba, ọ naghị echi. Ha dọrọ aka na ntị wee sị na ọ bụ naanị osisi ka a sịrị na a ga-egbu ya ọ ma kwụrụkwa ebe ọ kwụ. Okwu ha were bụrụ na ụmụigbo ga-azọwa onwe ha ma mekwee ihe ọbụla ha nwere ike ime iji chekwee ndụ ha. Ha wee sị “anyị agaghị ekwekwe ka ndị bịara nʻala anyị na-egbu anyị ka a na-egbụ ọkụkọ. Nke a ga-akwụsị.”

Leave a Reply