Akụkọ Ụwa

Achịbishọọpụ Emmanuel Chukwuma Amaala Ọkwa Gbasara Ruga

Archbishọọpụ Chukwuma

Ụkọchukwu ukwu na-achị ndụ ụka Selemensi na mpaghara Enugwu bụ Achịbishọọpụ Emmanuel Chukwuma amaala ọkwa na ọgbaaghara ga-ada ma ọ bụrụ na atụmatụ Ruga adị ire na ndịda-ọnwụnwaanyanwụ Naịjirịa. Onye nsọ a kwukwara na gọvanọ ọnwụwaanyanwụ ọbụla kwadoro Ruga ga-eji anya ya hụ ntị ya. Ọ sịrị na ya onwe ya ga-ebu ọgbaaghara ga-adapụta nʻisi maka na agwo emeghi ihe o jiri bụrụ agwọ, ụmụaka ewere ya kee nkụ.

Mgbe ọ na aka ụka onyinye na St Ebenezer Anglican Church di na Independent Layout nke Enugwu, Maazị Chukwura gwara ndị na-ege ntị ka ha kee nkwụcha ma dịkwa njikere ime ihe ọbụla ha nwere ike ime iji hụ na atụmatụ Ruga adịghị ire. O were sị na “gọvanọ ọbụla wara anwa nye ala maka Ruga, a ga-achụpụ na nʻọkwa”.

Mgbe ọ na-ekwu okwu na-aga nʻihu, Achibishọọpụ Chukwura sịri na ụjọ a onyeisiala bụ Mohamed Buhari maọbụ onye ọzọ anaghị atụ ya. O wee kwuo na “onye nọ nʻime m karịrị onye nọ nʻụwa”. Ọ kpọkuru ndịụka ebe niile ha nọ ka ha na-ekpe ekpere akwụsịghị akwụsị ka atụmatụ ọjọọ ọ-bịara-be-onye -bịagbuo-ya a ghara idi ire. 

Leave a Reply