Akụkọ Ụwa

Ndị Okenye Akpọọla Oku Ka E Nyochaa Okorọcha

Maazị Rochas Okorocha

Ọgbakọ ndị okenye kpọrọ onwe ha Orlu Elders Council akpọkuola Onyeọchịchị Steeti ahụ bu Maazị Emeka Ihedioha ka o nyochaa etu onye chịburu steeti ahụ bụ Maazị Rochas Okorocha siri mefu ego mgbe ọ nọ nʻọchịchị. 

Onyeisioche ndị otu a, bụ Ọkammụta Francis Dike (SAN), kwuru nke a mgbe o jere kpọtụrụ Osote Gọvanọ bụ Maazị Gerald Irona. Ọkammụta Dike boro ebubo wee sị na Maazị Okorocha mere mpụ dị egwu na Steeti Imo site nʻimefu ego etu o siri masị ya nakwa ịkpakọrọ ihe dịịrị steeti niile ka a aga-asị na ọ bụ nke ya. Ọ gakwara nʻihu kwu na Maazị Okorocha nyere iwu dị iche iche nke bụ iwu arụrụala megidere Steeti Imo. 

Mgbe ọ na-aga nʻihu, Ọkammụta Dike kpọkwara oku ka a kpọghachi Onyeeze Cletus Ilomuanya onye nke e wepụburu dịka onyeisioche ndị ọchịchị ọdịnala.

Leave a Reply