BOSTON – Ụbọchị Satọdee Ọnwa Ọgọsọsịtị dị nʻụbọchị iri na otu ka ndịigbo bi na mba mebere New England nke Amerika (Massachusetts, Rhode Island, Connecticut, Maine, New Hiampshire na Vermont) mere mmemme Ncheta Ụbọchị Ndịigbo (Igbo Day) nke afọ 2019. Mmemme a nke omenafọ na-akpọkọta ndịigbo niile, ma nwata ma okenye, iji gosipụta ma kwalite asụsụy, omenala na ọdịnala Igbo.

 

Nʻokwu nnabata ya, onye ndu ndịigbo na New England bụ Ọkammụta Ejike Eze (Omenka), onye hiwere mmemme a mgbe ọ batara nʻọkwa, kelere ndị niile hapụrụ ihe ha na-eme were bia mmemme ahụ, tumadị ndị si alaigbo were bia. O kwuru na nke a bụ afọ isii ndịigbo na-eme mmemme a kemgbe ọ malitere ọchịchị. Ọ gara nʻihu gụpụta ụfọdụ ihe ndị ya na ndị otu ya mepụtara kemgbe ha malitere ọchịchị, tinyere nhiwe ụlọakwụkwọ ebe a na-akuzi asụsụ na omenala Igbo na mba Amerika. Ọ kọwara na ọtụtụ ụmụaka a mụrụ nʻAmerika na-asụ Igbo taa nʻihi mbọ ya na ndị otu ya na-agba nʻụlọakwụkwọi a. Ọ kpọrọ oku ka ndịigbo niile na-agba mbọ ikwalite asụsụ na omenala Igbo ebe ọbụla ha nọ.

 

Ụfọdụ nʻime ihe ngosi e mere ụbọchị ahu bụ mmọnwu si ebe di iche iche, egwu ọdịnala nke mba dị iche iche gosiri nakwa egwu ụmụakwụkwọ Igbo gbara. Nʻasọmmpi ngosi ọdịnala nke e mere, ndị obodo Ọkija butere iko ọkaibe, Nkporo bụ ndị nke abụọ, ebe Enugwu na Anambra gbara ndị nke atọ.

 

Omenka Ejike Eze Nabatara Eze Aja Nkporo

Ụfọdụ ndị eze bịara mmemme ahụ tinyere Eze Patrick Ogbuagu (Eze Aja Nkporo) na Igwe Peter Okwesili (Mmirinaezoroha nke Ibute Egede). Mmemme a bụ mmemme kacha ibe ya nke a na-eme iji gosi omenala Igbo na mba ofesi. Ihe karịrị puku mmadu isii sonyere na mmemme nke afọ 2019.