An Online Conference of the Igbo-Speaking World
Fri Nov 27- Sat Nov 28, 2020
Ụwandịigbo 2020 bụ ọgbakọ zuzugbe ụwa (global conference) ebe ndị ọkammụta na ndị niile isi na-anụ ọkụ nʻihe gbasara asụsụ, agụmagụ na omenala Igbo ga-ezukọ, gụpụtara ụwa ihe nchọcha (research) ha. Ihe niile a ga-ekwu na ya bụ ọgbakọ ga-abụ nʻasụsụ Igbo. Nke a bụ izizi a na-enwe ọgbakọ dị etu a ebe a ga-asụ naanị asụsụ Igbo malite na mbido ruo na ngwụcha. Ndịọkammụta si mahadum dị iche iche na Naịjiria nakwa ofesi etinyele akwụkwọ maka ọgbakọ a. Ọgbakọ a ga-abụ na Zoom nakwa Youtube ka onye Igbo ọbụla chọrọ nwee ihe sonye.
Ọ bụrụ na Igbo na-adị gị mma, were ọsọ jee denye aha gị ebe a ka i soro na ndị ga-egere ihe a ga-agụpụta nʻọgbakọ a. Ọ bụrụ na i nwere ajụjụ, zigara ya admin@uwandiigbo.org ka ọ tụziere gị aka.
Ụwandịigbo bụ otu na-akwalite asụsụ na ọmenala Igbo. Ọrụ ha bụ ịhụ na asụsụ Igbo ruru ebe asụsụ mba ụwa ndị ọzọ ruru. Ọ bụrụ na ihe gbasara Igbo na-anụ gị ọkụ nʻobi, i nwere ike ịbanye nʻotu Ụwandịigbo site nʻidebanye aha nʻakwụkwọ ebe a. Onyeisi otu a bụ Ọkammụta Omenka Ejike Eze na-akpọ ndịigbo niile ka ha nyere aka kwalite asụsụ Igbo.
Ọ bụrụ na ị chọrọ iji onyinye ego kwado ọgbakọ a maọbụ kwado nkwalite asụsụ Igbo, jee ebe a nye onyinye gị
Ụwandịigbo 2020 Usoro Ngụpụta Edemede (Conference Presentation Schedule) |
||
Friday November 27 | ||
8:00AM (EST) 2:00PM (Nigeria) |
Omenka Ejike Eze Ozi Nnabata |
|
Ọnụụlọ 1 | Ọnụụlọ 2 | |
8:30:AM (EST) 2:30PM (Nigeria) |
Oyali, Uchenna Etu Ntụgharị Akwụkwọ Nsọ Baịbụlụ Siri Wụgharịa Asụsụ Igbo |
Ephraim-Chukwu, Anthonia Chinyere Nchekwaba Asusu Igbo n’odiniihu site n’ omenaala |
9:00AM (EST) 3:00PM (Nigeria) |
Anyachebelu, Adaora Lois Nkwudosike na Oganihu Omenala na Asụsụ Igbo … |
Nnabuihe Bright Chigozie Ihe E ji Ele Mma |
9:30AM (EST) 3:30PM (Nigeria) |
Ntakịrị Ezumike | |
Ọnụụlọ 1 | Ọnụụlọ 2 | |
10:00AM (EST) 4:00PM (Nigeria) |
Anchachebelu, Lois & Edoga, Patience Asụsụ na Ilu Igbo Ụfọdụ Na-Emegide Onwe ha |
Okafor, Ebele Eucharia Nzụlite Ụmụakwụkwọ na Nka Ọgụgụ Igbo: Ụzọ Kwesiri Ekwesi |
10:30AM (EST) 4:30PM (Nigeria) |
Oyeka, Chiamaka na Adaora Anyachebelu Ntọsasị Aha ʻNwaʻ Dịka O Siri Metụta Asụsụ na Omenala Igbo |
Ibezim, Oluchukwu Ntulekọrịta Ọnọdụ Ime Ọkwa n’Ala Igbo n’oge Gboo nakwa n’oge Ugbua: Mgbado Ụkwụ n’Obodo Mbaukwu na Nsukka |
11:00AM (EST) 5:00PM (Nigeria) |
Nrị Ehihie/Nri Uhuruchi | |
Ọnụụlọ 1 | Ọnụụlọ 2 | |
11:30AM (EST) 5:30PM (Nigeria) |
Ozi Pụrụ Iche – TBD | |
12:00PM (EST) 6:00PM (Nigeria) |
Eze, Roseline, Ugwuoke, Priscilla Ebele, Chineke, Stella Obioma & Obayi, Joy Ikuzi Asụsụ Epum nʻUsoro Ejije nʻỤlọakwụkwọ Jụnịọ Sekọndịrị |
Ohaike, Nkechi Óké Ngwakọta Asụsụ Igbo na Bekee: Ndọghachi Azụ Nye Nkwalite Asụsụ na Omenala Igbo |
12:30PM (EST) 6:30PM (Nigeria) |
Eze, Adaora Maudline Nkwuma Metụtara Ọnwụ na Mmekọrịta Nwoke na Nwaanyị n’ Usoro Okwu Igbo. |
Chiji Akoma E Nwere Iduazị Ụmụaka N’Igbo? |
1:00PM (EST) 7:00PM (Nigeria) |
Ntakịrị Ezumike | |
Ọnụụlọ 1 | Ọnụụlọ 2 | |
1:30PM (EST) 7:30PM (Nigeria) |
Toochukwu Hyacinth Esomonu Mkpa na Uru Akwụkwọ Akụkọụwa nʻAsụsụ Igbo Dị |
Okpala, Chinasa Patience Asu͙su͙ Igbo na Ụmụaka Igbo Bi na Legọọsụ |
2:00PM (EST) 8:00PM (Nigeria) |
Ahamefula Ndubuisi & Udechukwu Chinwe Ndịigbo na Nkwalite Asụsụ Igbo na Ihe E Merela |
Dimebo, Ifunanya Nzubechukwu Abụ Igbo n’Ịkwalite Mmụta Asụs ụ Igbo n’ogogo Ntaakara |
2:30PM (EST) 8:30PM (Nigeria) |
Ene, M.O. & Mbanefo, Yvonne Chioma Ndịigbo na Nkwalite Asụsụ Igbo |
Ihionu, Uzo Udaume, Mgbochume, na udaolu n’asusu Igbo: Nke bu eziokwu |
3:00PM (EST) 9:00PM (Nigeria) |
Mmechi | |
Saturday November 28 | ||
8:00AM (EST) 2:00PM (Nigeria) |
Oyeka, Chiamaka na Patience Edeoga Asụsụ Dịka O Siri Metụtata Usoro Mmepụta na Nkwado Erimeri nʻAlaigbo https://youtu.be/-L_0zqsHZBI |
|
8:30:AM (EST) 2:30PM (Nigeria) |
Anyachebelu, Lois & Edeoga, Patience
Asụsụ na Ilu Igbo Ụfọdụ Na-Emegide Onwe ha https://youtu.be/-uxTtvJbmOw |
|
9:00AM (EST) 3:00PM (Nigeria) |
Echebima Helen Chijiago Ihe Nkuzi Dị NʻAkụkọ Ifo Igbo Maka Nzụlite Ụmụaka https://youtu.be/7PPFGBIijKY |
|
9:30AM (EST) 3:30PM (Nigeria) |
Obiora Kenneth Ekezie Ajụjụ Ụfọdụ Anazabeghi Na Nchọcha Fọnọlọjị Igbo Izugbe https://youtu.be/_z2X4GIJ8Hs |
|
10:00AM (EST) 4:00PM (Nigeria) |
Onukawa, Ngozi Ntutegharị ọmụmụ asụsụ Igbo bido n’afọ 2020 gawa n’ihu: oke na ọrụ dịịrị ndi Igbo n’onwe ha, ma ọ nọ n’ụlọ, ma ọ nọ n’ije. https://youtu.be/A6PO9dRWKVM |
|
10:30AM (EST) 4:30PM (Nigeria) |
Ezebube Chinedu C., Ogechukwu Chukwuneke & Chioma Akaeze Aha Nna Ndị Igbo na Senchụrị nke Abụọ na Otu: Usoro na Mpụtara https://youtu.be/bwxjXAwUkB8 |
|
11:00AM (EST) 5:00PM (Nigeria) |
Edeoga, Patience Nonye Nsogbu Dị NʻIji Igwe Eme Ntụgharị Asụsụ Igbo https://youtu.be/e_UlTD-fqro |
|
11:30AM (EST) 5:30PM (Nigeria) |
Oyeka, Chiamaka Ngozi Ntọsasị Ahaajụjụ Dịka O Siri Metụta Asụsụ nʻObodo https://youtu.be/2gCE33RWzkM |
|
12:00PM (EST) 6:00PM (Nigeria) |
Ezika, Chidoo & Medolu, Agatha Ntụgharị na mmụba okwu n’asụsụ Igbo dị ka o si metụta okwu ndị e ji akọwa nwanne https://youtu.be/eiwH5zS70vA |
|
12:30PM (EST) 6:30PM (Nigeria) |
Mpamugo, Emmanuel Ihe Ụdaolu Na-Akọwa Banyere Mmebemusoro Okwu Igbo https://youtu.be/Q-HiWtolPHc |
|
1:00PM (EST) 7:00PM (Nigeria) |
Oraegbunam, Chukwuebuka Ndagba Okwu dịka Ụzọ ndị Odee Abụ Igbo si Ezipụta Nkwenye ndị Igbo banyere Elu Ụwa https://youtu.be/Z7OxmO9Gpjc |
|
1:30PM (EST) 7:30PM (Nigeria) |
Ikwubuzo, Iwu Odide Igbo na Ngwa Mkpari̩ta na Nziritaozi O̩ha Di̩ka O̩dum̀gbàliākwu̩ Na Nchekwa Asu̩su̩ Igbo https://youtu.be/XCa73bmhJyA |
|
2:00PM (EST) 8:00PM (Nigeria) |
Okemgbo, Asopuru Iwepu Akara Uhie (-) Gaenye Aka N’ide Asụsụ Igbo |
|
2:30PM (EST) 8:30PM (Nigeria) |
Ntukogu, Kanayo Uru Asụsụ Igbo Bara |
|
3:00PM (EST) 9:00PM (Nigeria) |
Ene, M. O. Ịhazigharị Mmemme Alụmalụ Ndiigbo https://youtu.be/x4HIqIlUG54 |
|
3:30PM (EST) 9:30PM (Nigeria) |
Omenka Ejike Eze Okwu Mmechi |
Ụwandịigbo 2020 – Ọkwa Dị Mkpa Maka Ndị Ga-Abịa Ọgbakọ
Ndeewo,
Daalụ maka idebanye aha nʻọgbakọ izugbe Ụwandịigbo 2020.
Ọgbakọ ga-amalite na Fraịdee Nọvemba 27 ruo Satọdee Novemba 28. Oge mmalite bụ 8AM oge EST nke bụ 2PM oge Nigeria.
Usoro ngụpụta ihe dị ebe a: https://uwandiigbo.org/uwandiigbo-2020/
Ihe ngụpụta niile ga-adị na YouTube ebe a ka i soro (subscribe): https://www.youtube.com/channel/UCA3nEsgtRpdRU0N6ifm6sBQ. Tinye “notification” ka YouTube mee ka ị mara mgbe ngụpụta ọbụla malitere.
Jee na www.uwand.iigbo.org/uwandiigbo-2020 maka ozi ndị ọzọ. Mee ka ọhanaeze mara maka nke a maka nkwalite asụsụ na omenala Igbo.
Igbo ga-adị.
Omenka Ejike Eze
Onyeisioche, Uwandịigbo
Nkwadobe Maka Ụwandịigbo 2020
Edemede:
Nke a bụ ichetere gị ka i zite edemede ị ga-agụpụta nʻọgbakọ Ụwandịigbo 2020. Edemede gị ga-erurịrị ndịnchịkọba aka tupu Ọkụtoba 31. A ga-enye onye ọbụla nkeji iri na ise iji gụpụta edemede ya na nkeji ise iji zaa ajụjụ. O nweghị onye ga-agafe oge e nyere ya. N’ihi nke a, ndịnchịkọba chọrọ ka onye ọbụla zite edemede ọ ga-agụpụta nke a gaghị akarị ihuakwụkwọ anọ. Edemede ga-adị na fọntị Times New Roman 12 ma nwee ohere ahịrị abụọ (double spaced). Dee aha gị, isiokwu edemede gi na aha ụlọakwụkwọ/ụlọọrụ gi ma zigara ya admin@uwandiigbo.org tupu Ọkụtọba 31, 2020. Cheta na nke a bụ edemede etu ị ga-esi gụpụta ya n’ọgbakọ; ọ bụghị edemede nke a ga-ebipụta na jọnalụ.
Ihe Onyoyoo Video
Iji hụ na ihe mberede dịka inwe ọkụ na ihe ndị ọzọ emebighị ọgbakọ a, ndịnchịkọba na-agwa onye ọbụla ka ha zite ihe onyooyoo (video) nke ga-egosi ebe ha na-agụpụta edemede ha. Ọ bụrụ na mberede adapụta, ndịnchịkọba ga-eji ya bụ onyooyoo nọchite onye ahụ. Mee ka video gị ruo anyị aka tupu Nọvemba 15.
Daalụ maka idebanye aha nʻọgbakọ nke Ụwandịigbo 2020 nke a ga-eme na Nọvemba 27-28, 2020. Biko jee na https://uwandiigbo.org/uwandiigbo-2020/ ka i lee usoro emume nakwa aha ndị ga-agụpụta edemede. Anyị ga-ezitere gị akara Zoom ị ga-eji banye nʻọgbakọ tupu oge eruo.
I nwee ajụjụ, zigara ya admn@uwandiigbo.org.
Ị chọọ isonyere Ụwandịigbo na Whatsapp, jee na https://chat.whatsapp.com/7Wb2Wh7set45q6nwPFmqum
Ịmata maka Ụwandịigbo, jee na www.uwandiigbo.org
Ndeewo.
Ndịnchịkọba Ụwandịigbo 2020