Edemede

Si nʻAka M.O. Ene

Biko, chaara mmadụ n’ụzọ!
Ị bụrụla agada gbachiri ụzọ?
Ọ’ụ gịnị ka ị kpa n’abụ?
Ị sị mụ amakwa onye ị bụ?
Éé, ama mụ onye ị bụ ọfụma!
Ị maghị onye ị bụ, ka ị ma ụma?
Biko jekwe jee jụọ ese n’ámá:
Amadị na nwa amaala ọbụla ma
Na ị bụ eze ọnọnkịtị enweghi efe,
Onye rere àlà nna ya zụrụ efe!
Alụkwa!
Tụfịakwa!
Mana uche bụrụ àkpà;
Ị nyakwa nke gị ka àkpà.
Nke na-akpa onye kpatara ya!
Nke na-eduzi onye duziwe ya!
Égwù anaghị atụ afọ…
O buru ụzọ na-aga Afọ!
Ahịa Afọ ma ahịa Nkwọ,
Eke na Orie sokwe Nkwọ.
A tụọrọ ọmara,
Ọmara amara!
A tụọrọ ofeke,
O fenye isi n’Eke!
Taa-a, nwoke à, chaa n’ụzọ
Ka ndịahịa jere Eke gaa n’ụzọ!

©MOE, 6.12.19

 

Otu ụbọchị, ele nọ n’akụkụ mmiri na-aṅụ mmiri. Ọ hụrụ onyinyo ya na mmiri. Ka mpi ya si maa ya mma, ọ sị:

“Lee ka mpi m ndị a siri maa mma. A sị na ihe niile dị n’ahụ m dịcha etu a, ọ gaara atọ m ụtọ karịa maka na ọ dịghị onye m ga-agbara ọsọ. Ma ụkwụ m ndị a kpọchara nkụ. Ihere ile ha anya na-eme m”.

 

Mgbe ọ na-ekwu nke a, ọ nụrụ mkpọtụ ndịnta na nkịta ha ka ha na-abịa. Ele wee riwe mbọ mbọ ọsọ, gbatee aka. Ma mgbe o ruru ebe ọhịa dị, mpi ya kodoro n’ụdọ ọhịa. Ka ọ nọ na-adọ mpi ya, ndịnta ahụ na nkịta ha gbakwutere ya, were jide ya.

 

Mgbe ọ gaje ịnwụ, o tiri mkpu si:

“Abụ m onye nzuzu. Anọ m na-eto mpi m ndị a na-egbu m ugbu a, ma na-ekwutọ ụkwụ m ndị a gaara azọpụta m.”

 

Ihe mmụta dị n’akụkọ a bụ na o kwesiri ka anyị na-etinye uchu n’ihe dị mkpa karịa naanị ihe mara mma.

 

Lolo Neboh (Nnedịọramma)

Ọfọ na Ogu

si n''aka MO. Ene

ỌFỌ ( the staff of true and rightful authority) bụ  óké eziokwu ( high honesty) na eziikike ruoro-onye  ( rightful authority). Nwoke tọchara n’ụmụnna ji ọfọ okenye (onyeísí na Nsụka). Ọkpara n’ezinaụlọ ọbụla ji ọfọ onyenchụàjà ( priest). Ji anaghị esi n’ọdụ epu ome.

E ji osisi ọfọ (maọbụ ọhọ/ọvọ) anochi anya nkwenye à n’àlà Igbo. Ya bụ na “osisi ọfọ” bụ ọ̀dị́màrà ( symbol) ikike pụrụiche, nke si na Chi maọbụ nke obodo niile kwetere ma hanye mmadụ n’aka. Onye weere “osisi ọfọ” ụmụnna ( agnate mace of aurhority) ma ọ jighi ọfọ (ọkachasị nke ndiichie haziri gboo-gboo), ihe anaghị agara ya ka ọ chọrọ na ka o chere.
Ọfọ bụ ike!
“Eji m ọfọ” bụ na mmadụ nwere ikike zuru-ezu.

OGU ( scepter of justice and innocence) bụ ikpenkwụmọtọ, ikpe ziri ezi na mmụọ na mmadụ, ikpe kwụ ọtọ nke gara ka ihe onye mere si dị. Na mmadụ ji ọfọ abụghị na ọ ga na-eme ihe masịrị ya. Ya ka Igbo ji adọ aka na ntị sị: “Onye ji ọfọ jidekwe ogu.” 
Ogu amana m!
“Eji m ọgụ” bụ na aka onye ahụ dị ọcha:
#########

Ugbu à ka ụfọdụ ga-amata na Ọfọnaogu dị ka Dharma.  (Ọ bụghị Karma.) Ihe mmadụ mere n’ụwa à, ọ ga-enwete ụgwọ ya n’ụwa à. Ma ọ bụrụ na onye ahụ chegharịa, mezie ihe ọ mebiri n’ihu mmadụ nakwa n’ihu mmụọ, àlà adị mma. Udo adị. Ọganiru esochie. (Ọ’ụ iwu à ji Naịjirịa agana n’ iru!)

Ala adịghị mma bụ ihe anyị mejọrọ: ọ bụghị ihe ndiichie mere. Nke onye metere, ọ kwụrụ na-eche ya. Onye na-asị “Ogu amana m!” ya jidekwe eziokwu (ọfọ) n’ihu mmadụ nakwa n’ihu mmụọ.

Jide ọfọ, jide ogu: ma i jighi ọfọ (eziokwu) na-eme ihe, ọgụ ga-ama gị ma i mejọọ. A naghị agwa dimkpa pụta n’anwụ okeehihie. Onye ma ákwà asa ahụ nwere ihe ọ na-ezo. Eziokwu gba ọ̀tọ̀, kwụrụ ọ́tọ́ ka sịga Kohiba Kubano! 🤣

Ka ọ dịwa n’awa ọzọ, maka na amamihe na-abịa n’awa n’awa! 🤷🏽‍♂️

MOE
@Aladimma