Ụwandịigbo Enweela Ọgbakọ Ahọ 2020, Kpọọ Òkù Nkwàlite Asụsụ Igbo

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor, Mmemme

Buusu sị na ọ bụ mmekọrịta ahụ bụ ụtọ nwanne, ebe ndị Igbo kwùrù na ọ na-abụ a gbakọọ aka ọnụ wee buo ozu enyi, ọ dị mfe.N’ịgbaso nke a, ndị Igbo asụsụ na omenala Igbo na-amasị nọrọ na nsonso a wee nwee nnukwu ọgbakọ izugbe pụrụ iche iji tụgharịkọta uche ọnụ banyere ọnọdụ asụsụ na omenala Igbo, ma tụkwa arò etu a pụrụ isi kwàlite ma mee ka ha […]

Òtù Akachukwu Akonam Ejirila Erimeri Kwádo Ụmụnwaanyị Ihe Na-Esiri Ike

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor, Mmemme

Igbo sị na omere nwaogbenye na-emere chi ya, maka na ọ na-abụ onye gọzie nwaogbenye, chi nwaogbenye agọzie ya.Ka ọ dị taa, òtù ọrụ obi ebere a maara dịka Akachukwu Akonam ejirila erimeri wee kwàdo ụmụnwaanyị karịrị otu narị n’ọnụọgụgụ bụ ụmụnwaanyị ajadụ na ụmụnwaanyị ihe na-esiri ike.Mmemme ikesà ihe ahụ a na-eme kwà ahọ ọbụla bụ nke weere ọnọdụ n’ụlọụka ‘St Stephens Anglican Church, Nnokwa’ dị n’okpuru ọchịchị ‘Idemili […]

Obianọ Amalitela Ikesàrà Ndị Ọrụ Oyibo Anambra Osikapa Ekeresimeesi

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor

Dịka o si eme ya kwà ahọ ọbụla, aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ nọrọ ụbọchị Tuzdee wee gbapee atụmatụ ikesàrà ndị ọrụ oyibo steeti ahụ akpa osikapa, iji mee ka ha mụrịa ma kwee oyooyo n’ime oge mmemme ekeresimeesi a.Ya bụ mmemme bụ nke e mere n’ogìgè isi ụlọọrụ oyibo steeti ahụ dị n’Awka, bụkwa ebe Gọvanọ ahọ na ndị ọrụ oyibo nọrọ wee nwekwa ọgbakọ na […]

Obianọ Agbapeela Amụmà Ọrụ Ugbo Ọkọchị N’Anambra

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor

Igbo sị na ọ na-abụ e jide ibe ji n’aka, a sàá agụụ okwu; maka na ọ na-abụ onye rie, ọ mụrịa.Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ nọrọ ụbọchị Wenezdee wee gbapee amụmà ịkọ ọrụ ugbo ọkọchị nke ahọ 2020 n’ime steeti ahụ.Mmemme ịgbape amụmà ọrụ ugbo ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ama egwuregwu Alex Ekwueme dị n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ, ma bụrụkwa nke ọtụtụ ọrụ […]

Ọba Akwụkwọ Anambra Achịkọbala Ọgbakọ Izugbe Maka Ndị Ndu Ọba Akwụkwọ Ohaneze

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor

 kọwaala ọba akwụkwọ ọhaneze dịka nke nwere nnukwu ọrụ pụrụ iche dịịrị ya n’imezùpụta ebumnobi ọkpụtọrọkpụ pụrụ iche nke otu mba ụwa United Nations wepụtàrà, bụ nke a maara na bekee dịka ‘Sustainable Development Goals (SDGs)’.Onyeisi mahadum Nnamdi Azikiwe dị n’Awka, bụ Ọkammụta Charles Okechukwu Esimone bụ ya kpọrọ oku a na mmemme abalị abụọ, a kpọrọ “Conference of National Librarian, Chairman And Directors of State Public Library Boards In […]

Ụmụakwụkwọ Unizik Arịọla Njikọaka Ụlọọrụ ANPC Maka Asọmpi ‘Hult Prize’ Ha Na-Achịkọba

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor

  Igbo sị na ọ na-abụ ọkọ kọba mmadụ, o jekwuru ibe ya, mana ọ kọba anụmanụ, ọ chọba ukwu osisi.Ka ọ dị taa, ụmụakwụkwọ na-ahazi asọmpi ‘Hult Prize’ na mahadum Nnamdị Azikiwe (Unizik) dị n’Awka, n’ime steeti Anambra akpọtụrụla ụlọọrụ ‘Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC)’ ma rịọ njikọaka ya n’ịgbasa ozi banyere asọmpi ahụ nke ahọ a. Onyeisi òtù nhazi asọmpi ahụ a maara dịka ‘Hult Prize Foundation’ […]

Ndị Enugwu-Agụleri Emeela Olili Ọbịbịa Eri Nke Ahọ 2020

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a, dịka ndị obodo Enugwu-Agụleri dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Anambra East’ nke steeti Anambra merùbèrè mmemme Oriri Ọbịbịa Eri, bụ otu nnukwu mmemme ọdịnala pụrụ ichè e jiri mara obodo ahụ.Ya bụ mmemme bụ nke ndị obodo ahụ na-eme kwà ahọ ọbụla, ma bụrụkwa nke ha sitèrè na ya na-akwanyere nnukwu nna mụsàrà ha ùgwù, bụ Eri, ónyé bụ nwa mbụ […]

Obianọ Atọọla Ntọala Ụlọọgwụ Nlekọta Akụrụ Na Nnewi

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ agbapeela ọrụ iguzòbe ụlọọgwụ ebe a ga na-elekọta akụrụ (kidney) mmadụ na Nnewi, dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Nnewi North’ nke steeti ahụ.Ya bụ nnukwu ụlọọgwụ bụ nke a na-arụ site n’aka otu onye nnọrọonwe, bụ Dọkịta Okey Chidolue, ma bụrụkwa ebe a ga na-agwọ ma na-elekọta ụdị ọrịa akụrụ dị iche iche, ma ihe gbasaara inyòchà, ịgbanwògharị na itinyegharị akụrụ.N’okwu ya […]

Ọnọdụ Nchekwa: Gọọmenti Anambra Na Ndị Keke Enweela Ọgbakọ

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor

Ọchịchị steeti Anambra nọrọ ụbọchị Wenezdee wee nwee ọgbakọ, ha na ndị na-anyà ụgbọala Keke Napep n’ime steeti ahụ.Ya bụ ọgbakọ bụ nke weere ọnọdụ n’ama egwuregwu Alex Ekwueme dị n’Awka, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee tụlee ma tinye okwu ọnụ banyere ihe metụtara òtù ahụ, mpụ na arụrụala, nakwa ọnọdụ nchekwa steeti ahụ.N’okwu ya n’ọgbakọ ahụ, odeakwụkwọ izugbe steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelu gbarụrụ ihu […]

Ngagharịiwe: Ndị Omekeome Amụnyela Legọọsị Ọkụ

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor

Ụlaga sị na ọ bụrụ na ya apịaghị ụtàrị, ụmaka anaghị ama na ya bụ mmanwụ.Ka ọ dị taa, ọ na-akpọtụ akpọtụ ugbua ma na-ekwo èkwò na steeti Lagos na ụfọdụ steeti dị iche iche, dịka ndị na-eme ngagharị iwe a na-enyo enyo na ha bụ ndị omekeome jiri iwe wee gbaa ọtụtụ ụlọọrụ na ihe ndị ọzọ dị iche iche ọkụ. Ndị ahụ a na-enyo ènyò na ha bụ ndị […]