Akụkọ ỤwaIzunna Okafor

Obianọ Amalitela Ikesàrà Ndị Ọrụ Oyibo Anambra Osikapa Ekeresimeesi

Dịka o si eme ya kwà ahọ ọbụla, aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ nọrọ ụbọchị Tuzdee wee gbapee atụmatụ ikesàrà ndị ọrụ oyibo steeti ahụ akpa osikapa, iji mee ka ha mụrịa ma kwee oyooyo n’ime oge mmemme ekeresimeesi a.
Ya bụ mmemme bụ nke e mere n’ogìgè isi ụlọọrụ oyibo steeti ahụ dị n’Awka, bụkwa ebe Gọvanọ ahọ na ndị ọrụ oyibo nọrọ wee nwekwa ọgbakọ na nnọkọ pụrụ ichè.

N’okwu ya na mmemme ahụ, Gọvanọ Obianọ mèrè ka a mara na ọdịmma ndị ọrụ oyibo so n’otu ihe na-echu ọchịchị ya ụra, bụkwa nke pụtara ihè na mbọ dị iche iche ọ na-agba iji kwàlite ọnọdụ obibi ndụ ha bụ ndị ọrụ nakwa etu ọrụ ha si aga, iji hụ na ha na-egòri ma na-arụsikwa ọrụ ike oge niile.
O kwuru na ahọ a adịchaghị ụmụ mmadụ ahụ mma, ma onye ukwu, ma onye ntà, n’ihi ihe ọdachi dị iche iche dapụtàrà n’ime ya, ma ọrịa nje korona na ngagharịiwe e mere ka a machie òtù ọrụ nchekwa SARS.

O mere ka a mara na ndị ọrụ oyibo steeti ahụ na-enweta ụgwọ ọnwa ha n’abalị iri abụọ na ise nke ọnwa ọbụla, ma kwe nkwà na ọchịchị ya agaghị ada mbà maọbụ laghachi azụ n’ime nke ahụ mgbe ọbụla maọbụ n’imezùpụtà nkwa ndị ọzọ ọchịchị ya kwere ha bụ ndị ọrụ oyibo, n’agbanyèghị na ọnọdụ akụnụba ala Nigeria nọ n’ụmị ugbua ma na-adaghachikwa azụ kwà ụbọchị ọbụla.
Gọvanọ Obianọ gara n’ihu kwuo na a ga-akwụ ụgwọ ọnwa nke Disembá tupu ụbọchị mmemme ekeresimeesi, ma mekwa ka a mara na onye ọbụla bụ onye ọrụ oyibo na steeti ahụ ga-eburịrị otu akpa osikapa wee laa n’ekeresimeesi a, dịka e si eme ya kwà ahọ ọbụla.
Dịka ọ na-ekwe Ndị Anambra nkwà na mmemme ekeresimeesi a na ahọ ọhụụ ga-aga siriri werere na steeti ahụ n’okpuru ezi ọnọdụ nchekwa bụ ịgbà, ọ kpọkùkwazịrị ndị ọrụ oyibo ahụ ka ha dị uchu n’ọrụ, ma na-arụpụta ihe kwesiri na ha ga-arụpụta dịka ụgwọ a na-akwụ ha nà nkwàdo gọọmenti na-enye ha siri dị.
Na nzaghachi ya n’aha ndị ọrụ oyibo ahụ, onyeisi ọrụ oyibo na steeti, bụ Maazị Harry Uduh kèlèrè Gọvanọ Obianọ maka ihe dị iche iche ọ na-emere ndị ọrụ oyibo n’ime steeti ahụ kemgbe ọ batara n’ọkwa ọchịchị n’ahọ 2014, ma kwe nkwà na ha ga-aga n’ihu ịrụpụtà ihe a hụrụ anya, iji mee ka steeti ahụ na-agawanye n’ihu karịarị ka ọ dị ugbua.Ọ rịọkwazịrị ndị ọrụ oyibo ahụ ka ha kwụghàchi Gọvanọ mmesoọma ya niile site n’inye ọchịchị ya nkwà na ngalaba na mpaghara ọbụla ha nọ na steeti ahụ.
A nọrọ na mmemme ahụ wee gosikwa Gọvanọ Obianọ mmadụ asaa bụ ndị ọrụ oyibo steeti Anambra soro wee nata onyinye nkwanyeugwu pụrụ iche site n’aka gọọmenti etiti maka ezi ọrụ ha, bụ nke a kpọrọ ‘Nigeria Public Sector Leadership and Productivity Award’.
Mmadụ asaa ahụ gụnyèrè Maazị Uche Nworah, Dọkịta Emmanuel Ude-Akpeh, Oriakụ Carol Njaka, Oriakụ Stephnie Keri-Uzo, Oriakụ Ngozi Onuorah, Maazị Adebayo Oyejinka, na Maazị Uchenna Ezeani.
Gọvanọ Obianọ nọkwàzịrị n’ebe ahụ wee nabàta ndị ahụ ma naa ha aka maka igosi na ha bụ ọkaibe n’ezi na ngalaba ọrụ ha dị iche iche.

Leave a Reply