Akụkọ ỤwaIzunna OkaforMmemme

Òtù Akachukwu Akonam Ejirila Erimeri Kwádo Ụmụnwaanyị Ihe Na-Esiri Ike

Igbo sị na omere nwaogbenye na-emere chi ya, maka na ọ na-abụ onye gọzie nwaogbenye, chi nwaogbenye agọzie ya.
Ka ọ dị taa, òtù ọrụ obi ebere a maara dịka Akachukwu Akonam ejirila erimeri wee kwàdo ụmụnwaanyị karịrị otu narị n’ọnụọgụgụ bụ ụmụnwaanyị ajadụ na ụmụnwaanyị ihe na-esiri ike.
Mmemme ikesà ihe ahụ a na-eme kwà ahọ ọbụla bụ nke weere ọnọdụ n’ụlọụka ‘St Stephens Anglican Church, Nnokwa’ dị n’okpuru ọchịchị ‘Idemili South’ nke steeti Anambra, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee kesàárà ụmụnwaanyị ahụ ihe erimeri dị iche iche gụnyere: akpa osikapa, akpa garrị, igbe noduul, tinyere ihe ụfọdụ e ji esi nri.


N’okwu ya na mmemme ahụ, nwunye aka na-achị steeti Anambra bụ Oriakụ Ebelechukwu Obiano kpọkuru ụmụnwaanyị ahụ ma dụọ ha ọdụ ka ha na-ebikọ n’udo na ịhụnanya, na-atụkwàsị obi na Chineke ma na-enwekwa mmasị n’ihe gbasara Chineke.
Oriakụ Obianọ, nke onye nọchiri anya ya bụ nnukwu onye enyemaka pụrụ ichè nye Gọvanọ, bụ Dọkịta Mitchelle Onugbolu kèlèrè òtù ahụ maka nkwàdo ahụ nakwa ụzọ dị iche iche ha sigòrò kwàdo ndị ụmụ mmadụ, ma kpọkuo ha ka ha jide ka ha ji.Ọ rịkwàzịrị ndị ọnọdụ dịịrị mma na ndị ọzọ bụ ndị aka ji akụ ka ha na-echeta ma na-enyere ndị ụwa na-atụ n’ọnụ aka, ọkachasị n’ime oge mmemme ekeresimeesi a.


Na mbụ n’okwu ya onye chọpụtara ma bụrụkwa onye nkwàdo òtù ahụ, bụ Maazị Simon Ukpaka kọwara na ọ na-eme nkesà ihe ahụ kemgbe ahọ iri na otù gara aga dịka otu n’ime ntụnye òtù ahụ n’ịkwàdò ndị ihe na-esiri ike. O kwuru na ọ dị mkpa ka ụmụnwaanyị ahụ mụọ ọrụ aka dị iche iche, ma nwetekwa nkwàdo iji malite ihe ha mụrụ, maọbụkwanụ ha amàlite ahịa, iji si n’ụzọ dị etu ahụ na-enyere onwe ha aka. O kwezịrị ha nkwà inye ha ego nkwàdo na ego mgbazinye iji bido ahịa maọbụ ọrụaka ọbụla ha mụrụ n’ahọ na-abịa abịa.
O kelere ndị dị iche iche nyere aka n’otu ụzọ maọbụ nke ọzọ iji hụ na ụbọchị ahụ na mmemme ahụ gara nke ọma.O kelekwazịrị Oriakụ Obianọ maka nkwàdo ya nye òtù ahụ, site n’ibunyé ha ha akpa osikapa arọ ya dị iri (10kg) bụ nke dị otu narị n’ọnụọgụgụ, tinyere ụfọdụ ndị ọzọ nyere nkwàdo.
N’okwu nke ya, onye nchịkwa otu jikọtara ndị ajadụ na Nnokwa, bụ Oriakụ Christiana Obiekwe kèlèrè òtù Akachukwu Akonam maka afọ ọma ya, ma kpee ka Chineke gọzie ndị nyere aka ime ka ya bụ erimeri rute ha aka.
Onye ụkọchukwu nọ n’ụlọụka ‘St. Stephen’s Anglican Parish Nnokwa’ bụ Kanọn Michael Amaegbu chètààrà ọha mmadụ bịara mmemme ahụ na ọ dị ngọzị inye enye, ma nyekwa ndụmọdụ ka onye ọbụla ọnọdụ dịịrị mma cheta onye ọ ka mma, maka na ihe dị etu ahụ na-amasị Chineke nke ukwuu.A nọrọ na mmemme ahụ mee ịkwụ n’ahịrị na ife aka, kpee ekpere, bụọ abụ ma mekwa ihe ngosi pụrụ iché site n’aka ụmụnwaanyị ahụ, tinyere ụfọdụ ihe ndị ọzọ e jiri merùbe ụbọchị ahụ.

Leave a Reply