Ịlụ Nwaanyị n’Ala Igbo: Oge Mbụ Na Oge Ugbu a

Posted Leave a commentPosted in Izunna Okafor, Mmemme

Ịlụ nwaanyị bụ ọzọ dịịrị okokporo niile, ma bụrụkwa a na-agụrụ akwụ nwanne ya a na-éghè.Ọ bụ ụkwa ruo oge ya, ọ daa. Ịlụ nwaanyị bụ okokporo rie ọ lakpuo n’ihi na ọ bụ òkè ọhà, onye kere nke ya, ọ lakpuo be ya, ga ribe.N’ihi na a sị na ihe mmadụ ruru ogo ya wee rie, ọ bụghị akpịrị, ịlụ nwaanyị bụ omenala zuru ụwa ọnụ. Ya bụ, ndị […]

Ụwandịigbo Enweela Ọgbakọ Ahọ 2020, Kpọọ Òkù Nkwàlite Asụsụ Igbo

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor, Mmemme

Buusu sị na ọ bụ mmekọrịta ahụ bụ ụtọ nwanne, ebe ndị Igbo kwùrù na ọ na-abụ a gbakọọ aka ọnụ wee buo ozu enyi, ọ dị mfe.N’ịgbaso nke a, ndị Igbo asụsụ na omenala Igbo na-amasị nọrọ na nsonso a wee nwee nnukwu ọgbakọ izugbe pụrụ iche iji tụgharịkọta uche ọnụ banyere ọnọdụ asụsụ na omenala Igbo, ma tụkwa arò etu a pụrụ isi kwàlite ma mee ka ha […]

Òtù Akachukwu Akonam Ejirila Erimeri Kwádo Ụmụnwaanyị Ihe Na-Esiri Ike

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor, Mmemme

Igbo sị na omere nwaogbenye na-emere chi ya, maka na ọ na-abụ onye gọzie nwaogbenye, chi nwaogbenye agọzie ya.Ka ọ dị taa, òtù ọrụ obi ebere a maara dịka Akachukwu Akonam ejirila erimeri wee kwàdo ụmụnwaanyị karịrị otu narị n’ọnụọgụgụ bụ ụmụnwaanyị ajadụ na ụmụnwaanyị ihe na-esiri ike.Mmemme ikesà ihe ahụ a na-eme kwà ahọ ọbụla bụ nke weere ọnọdụ n’ụlọụka ‘St Stephens Anglican Church, Nnokwa’ dị n’okpuru ọchịchị ‘Idemili […]

Ndị Ihiala Ejirile Ọñụ Rie Ji Ọhụrụ

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor, Mmemme

Oke ọñụ dara na nsonso a n’obodo Ihiala dị n’okpuru ọchịchị steeti Anambra, dịka ndị obodo ahụ merùbèrè mmemme iri ji ọhụụ ha nke ahọ 2020.Mmemme Ịwa Ji ahụ e mere n’obi eze ọdịnala obodo ahụ bụ Igwe Thomas Ikenna Obidiegwu dọtàrà ụmụafọ obodo ahụ nọgasị n’ebe dị iche iche, ndị ikwu na ibe, ndị nwadiala, ndị enyi, ndị agbatobi na ndị ọzọ na-echère obodo ahụ ezi echichè.N’okwu ya oge […]

Ịgụ Aha n’Ala Igbo

Posted Leave a commentPosted in Izunna Okafor, Mmemme

Ịgụ Aha n’ala Igbo pụtara inye mmadụ, ọ kachasị nwata a mụrụ ọhụụ ahà, ma ọ bụ ịbà ahà, dịka ndị si asụ. Aha bụ njirimara onye ma bụrụkwa ihe onye na-aza. Onye ọbụla na ihe ọbụla dị n’ụwa nwere aha e jiri mara ya, ma ndị nwụrụ anwụ ma ndị dị ndụ; maka na onye enweghị aha nọ ọdụ ka oke osisi enweghị akwụkwọ. Ọbụnadị ụmụaka a mụrụ ọhụụ […]

Ndị Nimo Eriele Ji Ọhụrụ, Kpọọ Òkù Nkwalite Asụsụ Na Omenala Igbo

Posted Leave a commentPosted in Mmemme

Si n’aka Izunna Okafor, Awka, Nigeria Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a, dịka ndị obodo Nimo, dị n’okpuru ọchịchị Njikọka nke steeti Anambra merùbèrè otu oke mmemme e jiri mara ndị Igbo, bụ mmemme iri ji ọhụụ ha nke ahọ 2020. Ya bụ mmemme a kpọrọ Ịwa Ji Nimo bụ nke weere ọnọdụ n’obi eze ọdịnala obodo ahụ, dị n’okpuru ọchịchị Njikọka nke steeti Anambra, ma bụrụkwa […]

Mmemme Iri Ji Ọhụụ Dịka Omenala Igbo

Posted Leave a commentPosted in Mmemme

Si n’aka Izunna Okafor, Awka, Nigeria Iri ji ọhụụ abụghịzị okwu ọhụụ na ntị nwa ọbụla gbara ahọ n’ala Igbo. Ka ọ dị taa, ọtụtụ ndị na-enye ya nkwọwa dị iche-iche ma na-ahụtakwa ya dịka nke ma ọ bụ nke ọzọ. Kaosiladị, Igbo sị na-abụ e gburìsie anụ enyi, o kwere obubu, maka na ọ bụrụ na ọkpụ aja akọwaghị ihe ọ kpụrụ, òfèkè nwere ike ịkpọ nwansu amụ dike. […]

Ịgba Afa

Posted Leave a commentPosted in Mmemme

Si n’aka: Izunna Okafor     Ndị Igbo nwere ọtụtụ nkwenye dị iche iche, bụ ihe ha jidesiri aka ike, ma bụrụkwa nke sitere n’aka ndị nna nna anyị wee rute anya aka. Nkwenye ndị a abụghị naanị na ha sitere n’aka nna nna anyị ha wee rute anyị aka, kama, ha na-apụtakwa ìhè ma na-emezùpụtakwa emezupụta dịka a tụrụ anya. Ndị Igbo, ọkachasị na mgbe gboo, nwere otu usoro […]

Ubochi Ndi Igbo2

Nkwado Maka Ụbọchị Ndịigbo Ebirile Ọkụ na Boston

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Mmemme

Ndị Igbo bi na Boston, Massachusets nke dị na mba Amerika akwadowele maka mmemme ha ji akwalite omenala Igbo. Mmemme a nke ha kpọrọ Ụbọchị Ndịigbo bụ mmemme ha na-eme kwa afọ nʻama egwuregwu Franklin Park nke dị na Boston. Mmemme nke afọ 2019 ga-adị nʻụbọchị ọnwa Ọgọịsịtị ga-adị na mkpụrụ ụbọchị iri. Nʻokwu ya mgbe ọ na-akọwa maka mmemme a, Eze Ndịigbo na Boston bụ Okaa Ejike Eze (Omenka […]