Akụkọ ỤwaMmemme

Nkwado Maka Ụbọchị Ndịigbo Ebirile Ọkụ na Boston

Ubochi Ndi Igbo2

Ndị Igbo bi na Boston, Massachusets nke dị na mba Amerika akwadowele maka mmemme ha ji akwalite omenala Igbo. Mmemme a nke ha kpọrọ Ụbọchị Ndịigbo bụ mmemme ha na-eme kwa afọ nʻama egwuregwu Franklin Park nke dị na Boston. Mmemme nke afọ 2019 ga-adị nʻụbọchị ọnwa Ọgọịsịtị ga-adị na mkpụrụ ụbọchị iri.

Ubochi Ndi Igbo3

Nʻokwu ya mgbe ọ na-akọwa maka mmemme a, Eze Ndịigbo na Boston bụ Okaa Ejike Eze (Omenka nke Mbu nʻUdi)  kwuru na Ụbọchị Ndịigbo nke afọ a ga-akpụọkụ nʻọnụ ma pụkwaa iche nʻihi na ọ bụ nke ikpaazụ ya na ndị otu ọchịchị ya ga-achịkọba tupu ha ahapụ ọchịchị. O kwuru na ya na-atụ anya na ọhanaeze ga-apụta nʻuju bịa nyere aka kwalite omenala Igbo.

Ubochi Ndi Igbo1

Ọnụ ọma na-ata akwụ ọkpụrụkpụ, ọ dị ka ọ bụ ọsụkwụ. Mmemme iji kwalite omenala Igbo malitere wuwe ka ọkụ ụgụrụ kemgbe ndịigbo bi na New England họpụtara Omenka dịka Eze Ndịigbo na New England afọ isii gara aga. Ọ bụ mgbe a ka ndịigbo niile bi na mpaghara Amerika a malitere gbakọwa ọnụ nʻama egwuregwu iji mee mmemme e ji echete omenala Igbo. A sị na awayị tọwa ụtọ, a bachanwekwuo ya ji. Kwa afọ, otu na-achịkọba ya bụ mmemme nke onyeisi ha bụ Ichie Bonny Chiuba Chibueze (Ọzọ Akụolisa na Nise) na-ewepụta ihe ọhụrị iji mee ka ya bụ mmemme na-ekpo ọkụ.

 

Mgbe a gbara ya ajụjụ ọnụ, Ọzọ Akụolisa sịrị na ya na ndị otu ya na-eme ihe niile ha nwere ike iji hụ na mmemme a gara nke ọma. Ọ sịrị na mmọnwụ kara aka dịka Ijele nakwa ndị ọzọ ga-esi Ala Igbo wee bịa. O kwukwara na ndị eze na ndị nze na ọzọ ga-esi ebe dị iche iche bịa sonye na mmemme ahụ.

Ihe karịrị nde mmadụ ise sonyere na mmemme a nʻafọ gara aga.

Leave a Reply