Akụkọ Ụwa

Gọvanọ Obiano Ekwela Nkwa Nde Naịra Ise Maka Onye Gbara Ama Gbasara Ọnwụ Maazị Igboka

Anambra

Aka na achị Steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obiano, ekwela nkwa na a ga-enye onye ọbụla gbara ama gbasara ọnwụ Onyeisioche ndi Nimo, bụ Maazị Frank Igboka, nde naira ise dịka ihe nrite. Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka mgbasa ozi nʻAnambara bụ Maazị Don Adinuba kwupụtara nke a mgbe ndị nta akụkọ na-agba ya ajụjụ ọnụ. Ọ sịrị na ọnwu Maazị Igboka wutere Gọvanọ Obiano nke ukwu nke mere o jiri were kwe nkwa ahụ. O kwukwere na Gọvanọ Obiano agwala ndị uwe ojii na kama ihe siri nʻọkụ agaghi eghe, nkụ gwụchaa. Gọvano kwuru na ndị niile kwafuru ọbara nʻAnambra kemgbe afọ ise gara aga na-esi igwe nʻimi nʻụlọ mkpọrọ ugbu a. O wee kọwaa na nke ndị gburu Maazị Igboka agaghị adị iche. O kwuru sị na “mgbe a nwudere ha, ha ga-eji anya ha hụ ntị ha”.

Ndị omekaome gbagburu Maazị Igboka na Nimo, nke dị nʻokpuru ọchịchị Njikoka, Steeti Anambara, mgbe ọ si ebe o jere zụrụ ihe alọghachi nʻụlọ ya. Ọtụtụ ndi maara Maazị Igboka kọwara ya dịka ezigbo mmadụ nke anaghi atụji ome ji mmadụ. Ọ bụghị mmadụ na-achọ okwu nke o ji achọ ụka dịka otu onye Nimo maara ya nke ọma siri kwu.

Nʻozi ya, ọnụ na-ekwuru ndị uwe ojii nʻAnambara bụ Maazi Haruna Mohammed kwuru na ndị ojiegbeezu ahụ, nke a sịrị na ha dị mmadụ anọ nʻọnụọgụgụ, ghara Maazị Igboka mgbọ karịrị iri abụọ na ise iji wee hụ na ọ nwụnyụrụ anya pịị. O were foro ntutu taa, wee kwuo na ya ha ndị ọrụ ya ga-eme ihe niile ha nwere ike iji  wee hụ na a nwụdere ndị ekperime a. Ọ kọwara na ihe a na-ata agwụghị, ntị anaghi ezu ike.

Leave a Reply