Akụkọ Ụwa

Awụsa Na-Achị Ehi Awakpola Obodo Gọv Okowa na Steeti Delta

Nwata nna ya zuru ohi na-eji ụkwụ agbawa ụzọ. Ndị Awụsa emekwele ka ha si eme. Na nke ugbu a, ha wakporo obodo Owa-Alero dị nʻokpuru ọchịchị Ịka na Steeti Delta. Owa-Alero bụ obodo gọvanọ na-achi Steeti Delta bụ Maazị Ifeanyị Okowa. Ndị osochiegbu a jiri mma bọọ, ka a na-abọ anụ ọhịa, otu nwaanyi na-achụ nta ihe ọ ga-eri nʻugbo ya.

Nwaanyị a bụ Odoziakụ Jomo Nwahmdi dịzị ka ihe ọnwụ kwere ọnụ mana chi ya mụ anya. Ndị
hụrụ ya nʻụlọọgwụ sịrị na ọ hụọ akị nʻọkụ ma kụọ ya na ọ ga-epu ome. Ọ bụ eziokwu na ndị Awụsa a jiri mma rie ya ka ji, a na-atụ anya na nwaanyị a ga-adị ndụ zụọ ụmụ ya.

Ihe gbasara mmekpaahụ ndị Awụsa bụzị kwa izu kwa ọnwụ. O nweghị ihe mmadụ na-eme ha maka na nwannụnụ na-agba egwu nʻakụkụ ụzọ, ihe na-akụrụ ya egwu nọ nʻakụkụ ọhịa.

Leave a Reply