Akụkọ Ụwa

Arụ Emeela n’Agụleri

Ndị ichie nʻAgụleri agwala mmadụ anọ si nʻobi Eze Idigo ka ha were ihe karịrị otu nde naira na ọkara were kpụọ arụ nʻihi nsọala nke ha mere na mba ahụ. Nke a na-eme mgbe a họpụtachara eze ọhụrụ na mba ahụ.

Mmiri malitere gbarụwa nʻAgụleri mgbe eze na-achị obodo ahụ, bụ Eze Christopher Nwabụnwanne Idigo, nwụrụ ka ọ chịchara mba ahụ ihe karịrị iri afọ abụọ na anọ. Ka ya bụ mmiri siri banye nʻopi ụgbọgụrụ bụ na ozigbo e chichere Maazị Michael Idigo eze iji nọchị nwanne ya nwụrụ anwụ, ndị mkpasa jere chikwasakwa nwanne ya nwoke bu Maazị Gabriel Chika Idigo eze. Ndị Agụleri anyị gbara ajụjụ ọnụ sịrị na ha ahụbeghị mgbe mba ahụ nwere eze abụọ otu mgbe. Ndị ichie wee kwuo na nke a bụ arụ, were gwa ndị ezinaụlọ Idigo ka ha kpụọ arụ tupu ala eghee ha ka e ghere ụkwa.

Ndị a gwara ka ha kpụọ arụ ahụ bụ Eze Michael Idigo, onye nke ndị ọchịchị Steeti Anambra nyere ikike ọchịchị, Nwaeze Fidelis Idigo, Nwaeze Mike Idigo na Nwaeze Ike Idigo.

Tinyere otu nde naira na ọkara a gwara ha nweta, ndị nyụrụ ahụrụ isi a ga-enyekwa ndị ichie otu ehi Igbo, otu uvuri ọkụkọ ọcha, nnukwu ọjị atọ nọchitere mkpụkpụ Agụleri atọ nakwa ji iri anọ. Ndị ichie gbujinyekwara onyekpuwere Nwaeze Gabriel Idigo okpu nha ruru narị puku naira ise.

Leave a Reply