Akụkọ Ụwa

Mahadum Nnamdị Azikiwe Enweele Onyeisi Ọhụrụ

Ọkankuzi Esimone 

Mahadum Nnamdị Azikiwe dị nʻỌka enweele onyeisi ọhụrụ nke aha ya bụ Ọkankuzi Charles

Esimone. Ọkankuzi Esimone meriri mmadụ iri atọ na asaa ndị ọzọ chọrọ ọrụ ahụ were bụrụ ọkaibe. Ọ ga-anọ nʻọkwa ahụ afọ ise.

Onyeisi mgbasaozi Mahadum ahụ bụ Ọkaa Emmanuel Ojukwu siri na ọ bụ eziokwu na mmadụ iri atọ na asatọ zọrọ ọkwa ahụ, naanị mmadụ asaa bụ ndị maara ihe ekwe na-akụ. Ọchịchị Ọkankuzi Esimone ga-amalite ụbọchị ọnwa Juunu ga-adị na mkpụrụ ụbọchị anọ nʻafọ a.

Tupu Ọkankuzi Esimone eweta ọrụ a, ọ bụ osote onyeisi Mahadum ngalaba agụmakwụkwọ na Mahadum ahụ.

Leave a Reply