Akụkọ Ụwa

Maazị Christian Chukwu Awụchiele na Lọndọnụ Ịgwọ Onwe Ya

Maazị Christian Chukwu

Otu onye ụkwụ ya na-aghọ nkọ ka agụwa nʻegwregwu bọolụ, onye nke bụkwa onyendu ndị egwuregwu bọọlụ Green Eagles nke Naịjirịa mgbe elu bụ ala ọsa, bụ Maazị Christian Chukwu, awụchiele na Lọndọnụ ka a gwọọ ya ọrịa jidere ya. Maazị Christian Chukwu, nke e jiri Chairman were mara, na nwunye ya bụ Lilian Nkeiruka, rutere Lọndọnụ ka ndị dibịa Bekee ihe mere ya bụ agadi nwaanyị ka ọ dị ka e jighi ego lụọ ya. Ebe ọ bụ na a naghị ahapụ ihe dị n’anya arahụ ụra, Maazị Chukwu na ndị dibịa Bekee nọ na Lọndọnụ, ndị nke na-ahụ maka mkpụrụobi, enyiela agba na-atufughi oge.

Tupu Maazị Chukwu ahapụ Naijiria, ọ bụ onyeisi ndị otu na-achịkọta egwu bọọlụ na Naijiria a kpọrọ Nigerian Football Federation (NFF), bụ Maazị Amaju Melvin Pinnick haziri ihe niile gbasara ọgwụgwọ ọrịa Maazị Chukwu. Ọtụtụ ndịisi NFF nakwa Nigerian Women Football League sokwa duputa Maazị Chukwu na nwunye ya n’ọdụụgbọelu mgbe ha na-amalite mjem ahụ.

Maazị Chukwu kelere ndị NFF nakwa ndị niile ihe gbasara ọrịa meturu n’obi ha nwere nyere aka. Otu n’ime ndị tunyere ụtụ ego gbara ọkpụrụkpụ bụ Maazị Femi Otedola onye majinyere puko dọka iri ise maka maka ọgwụgwọ ọria Maazị Chukwu.

 

Ụwandịigbo na-ekpere Maazị Chukwu ekpere ka ọ gbakee ngwangwa. 

Leave a Reply