Akụkọ Ụwa

Maazị Nwankwọ Kanu Amalitere Ebe Ọzụzụ Ndị Egwu Bọọlụ

Nwankwo Kanụ

 Ihe ọ sọrọ sị mee enwe, anya ga-atọrịrị ya nʻelu osisi. Ọ bụ eziokwu na Maazị Nwankwo Kanu kụchara egwuregwu bọọlụ laa ezumike, uche ya ka nọkwa nʻegwuregwu bọọlụ. Ọ bụ ya mere Maazị Kanu jiri malite ebe a na-azụpụta ndị chọrọ iji egwuregwu bọọlụ aracha aka. Ụlọ egwuregwu ahụ nke a kpọrọ Kanu International Football Academy (KIFA) nwere ngalaba iri abụọ na Naịjirịa mana isiụlọọrụ ha dị na Legọọsị.

Mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu maka KIFA, Maazị Kanụ sịrị na nke a bụ ụzọ ya chọrọ iji nyere ụmụaka Naịjirịa aka maka na a sị onye chi ya gọziri gọzie ibe ya. Ọ sịrị na KIFA ga-azụ ụmụaka ma nʻegwuregwu bọọlụ ma nʻakwụkwọ. O wee gwa ụmụaka Naịjirịa ndị ga-eje KIFA ka ha gbasie mbọ ike maka na onye riri elu ọjị ga-agba mbọ kpara ya nkụ ma gbọrọ ya nri ewu nʻihi na a naghị arị ọjị daa.

 

Ụwandịigbo na-ebugara Maazị Kanu ụkpa ekele ka o siri cheta ndị ihe na-esiri ike.

Leave a Reply