Akụkọ Ụwa

Gọvanọ David Umahi Nke Ebọnyị Abụọla Ndị Otu Nzuzo Ọnụ

Gọvanọ Umahi

Igbo sịrị oke amana ụma taa akpa dibịa, ma dibịa amana ụma bụọ oke ọnụ. Mana Gọvanọ David Umahi na-achị Steeti Ebọnyị abụọla ndị otu nzuko dị iche iche na steeti ya ọnụ. Gọvanọ Umahị gwara ndị ụlọ na-emebe iwu na steeti ahụ na onye otu nzuzo ọbụla ewepughị aka enwe nʻofe tupu abalị asaa ga-ahụ ihe ndị mmụọ ji ntị oke eme.

Gọvano Umahi kwuru nke a mgbe ọ na-ebinye aka nʻakwụkwọ maka iwu ọhụrụ na steeti ahụ. Ọ gwara ndị na-ege ntị na ya agaghị enye onye ọbụla a na-enyo enyo dịka onye otu nzuzo ọrụ. O kwukwara na aka ndị uweojii kpara onye nzuzo ọbụla, na a ga-atụ onye ahụ nga mkpụrụ ọka.

Mgbe o ji iwe na-ekwu okwu nʻihi mkpamkpa ndị otu nzuzo na-akpa, Gọvanọ Umahi sịrị na ndị otu nzuzo akwafuole ọbara ụmụmmadụ karịrị akarị. Mana o cheteere ndị oso chi egbu a na ọbara siri ike. O wee si na onye ọbụla kwafuru ọbara ga-anata ụgwọ ọrụ ya nʻihi na onye riri amụ ebule ji ibi ụgwọ. O kwuru sị, “ị bụrụ onye otu nzuzo Aye, ndị otu unu gbuo mmadụ na Legọọsị, gịnwa nọ nʻEbọnyị nwere aka na ya”.

Leave a Reply