Akụkọ Ụwa

Ọdụ Ụgbọelu Dị nʻEnugwu Nwere Ike Imechi

Ọdụ Ụgbọelu Akanu Ibiam

Onyeisi na-ahụ maka mjem ụgbọelu na Naịjirịa bụ Maazị Hadi Siraka ekwuole na ọdụ ụgbọelu dị nʻEnugwu, nke a na-akpọ Akanu Ibiam International Airport, nwere ike imechi na nso nso. O kwuru na ihe ga-ebute mmechi a bụ na ọdụ ụgbọelu ahụ adịghị etu o kwesiri ịdị.

Nʻezie, ọtụtụ ndị merele mjem site nʻọdụ ụgbọelu ahụ kwuru na o riri mperi nʻebe dị iche iche. Ụfọdụ sịrị na ọdụ ụgbọala ụfọdụ ka ya mma. Okporo ụzọ ụgbọelu, nke a kpọrọ runway, adịghị mma. Ntụoyi adịghị ebe o kwesiri ịdị. Ndị ọrụ anghịkwa arụ ọrụ etu ha kwesiri. Kama anya ha niile dị nʻego ka anya ijiji si dị nʻikpo nsị.

Nʻafọ gara aga, ọgbakọ ndọ gọvanọ ọnwụwaanyanwụ rịọrọ gomenti etiti Naịjirịa ka ha gbaa mbọ mezie ya bụ ụgbọelu mana okwu ha niile dị ka ebe a na-awụsa mmiri nʻokwute. Ọtụtụ ndị Igbo ahụla nke dịka otu ụzọ ọzọ gomenti etiti si emegide ụmụigbo.

 

Mgbe gomenti etiti kwuru na ọdụ ụgbọelu ahụ ga na-anabatazi ụgbọelu si mba ofesi, ụmụigbo chere na ihe ọma emeerele ha. Mana kemgbe ahụ, naanị ụgbọelu ofesi si na ya efeda efelikwe bụ ụgbọelu Ethiopian Airline. Nke a were dịzịa ka ọkụkọ si nʻala felie begoro na mkpumkpu aja. Mana ka a na-ekwu na nkịta mụrụ naanị otu nwa, ọ kpụrụ ya na-achọ ịtagbu. Ụwandịigbo na-arịọ ụmụigbo ihe ọma dị mma ka ha tinye ya bụ okwu ọnụ maka na onye isi tufuo ụdara ọ zọtara nʻụkwụ, o nweghị onye ga-enye ya ọzọ.

Leave a Reply