Akụkọ Ụwa

Ndị Uweojii Nọ nʻAba Aghọọla Nkịta Tara Ọkpụkpụ A Nyawara Ha nʻOlu


 

 

 

 

 

Ndị bi nʻala Enyimba bụ Aba, etiele mkpu tikuo ụwa niile na-akọwa na ndị uweojii nọ na mba ahụ na ndị omekome bụzị ara na obi. Ha sịrị na ebe ọ kache ewute ha bụ na ndị ohi, ndị soja na ndị Uweojii dịzị ka ha na-egbunye nʻotu akpa. Ụfọdụ nʻime ha sịrị na ọ bụ egbe ndị uweojii ka ndị abalịdịegwu a ji eje ohi. Ha wee na-akọwa na ha bụ ndị bi nʻAba na-eze ndị ohi, eze ndị soja ma na-ezekwe ndị uweojii.

Otu onye a gbara ajụjụ ọnụ sịrị na ha anaghị ehizi ụra nʻụlọ ha nʻihi ụjọ ndị abalịdịegwu. “Ị kpọọ ndị uweojii ka ha nyere gị aka, ị mara na i jirile aka gị kpatara onwe gị nkụ ahụhụ. Ndị ohi ga-agwa gị ihe niile gị na ndị uweojii kpara. Nke a gosiri na ọ bụ ote nọ nʻụlọ gwara nke nọ nʻọhịa na azụ dị na ngịga” Ọ sịrị na ebe ọ kacha njọ bụ nʻakụkụ Ọgbo Hill dị nʻAba ebe ndị ohi werele dị ka nke ha. Ụjọ anaghịkwa ekwe ụmụmmadụ tinye isi ebe ahụ.

Ọtụtụ ndị bi nʻAba na-akọwa na ọ bụrụ na ndị uweojii kwụsị gị nʻụgbọala i nyeghị ha ngarị, ha agwa ndị soja kụọ gị ihe ụzụ kụrụ igwe.

 

Na mgbe mbụ, ọ bụ ndị uweojii ka a na-arịa nʻihe gbasara ngarị mana ugbu a, nke ndị soja kazị njọ. Otu onye gwara anyi sị, “gaa hụrụ ihe ha na-eme nʻObikabịa. Ha na-ejizi ndị ọchọnganoko anakọta ndị na-akwọ ụgbọala ego”.

Leave a Reply