Akụkọ Ụwa

Saraki Etoole Ụmụnwaanyị Egwu Bọọlụ Super Falcons

Super Falcons

Ụbọchị Satọdee gara aga ka ụmụnwaanyị egwuregwu bọọlụ Naịjirịa a kpọrọ Super Falcons jiri ọkpụ isii a sara ise were merie ndị ogbo ha ndị Cote d’Ivoire were buru iko West African Footbool Union (WAFU).

Onyeisi ụlọ ukwu na-emebe iwu na Naịjirịa toro ụmụagbọghọ a maka ike ha kpara nʻasọmmpi egwuregwu ahụ. Nʻozi o sị nʻọnụ onye ndụmọdụ ya na-ahụ maka mgbasaozi bụ Maazị Yusuph Olaniyonu were zisaa, Maazị Saraki sịrị na ala anyị bụ Naịjirịa ji ụmụagbọghọ a eme ọnụ nʻihi na ha tigburu agụ. Ọ gara nʻihu were kwuo na ihe ha mere bụ ihe ndị na-eto eto na Naịjirịa kwesiri in̄omi.

 

Maazị Saraki tokwere ndịmgbazi Super Falcons nakwa ndị ndu ha niile. O kwuru na nke a ga-ebuli mmụọ ha elu iji gaa nʻihu bute iko mba ụwa nke ga-amalite nʻọnwa na-abịa na mba Fụransị maka na e too ogbu ebule, o gbuo ehi.

Leave a Reply