Akụkọ Ụwa

Ndị APGA Ebole Gọvanọ Obianọ Ebubo

Gọvanị Willie Obianọ

Otu kpọrọ onwe ha APGA Peopleʻs Alliance ebole gọvanọ na-achị Steeti Anambara bụ Maazị Willie Obianọ ebubo na ọ chọrọ ime ha “i were nke a i rie m ego” nʻihe gbasara ịhọpụta onyeisioche otu ndọrọndọrọ APGA. Ndị otu a were maara ya bụ gọvanọ ọkwa ka ọ gharakwa ịkpa nwa agụ aka nʻọdụ maka na ọ nwaa nke a anwaa, ya ezị ya ihe ọkụ na-eme ntị oke.

Nʻozi ha gbasara ka o ruo ọhaneze ntị, ndị otu a sịrị na Maazị Obianọ chọrọ iji ụzọ ngọngọ mee nwanne ya nwoke bụ Maazị Primus Odili, onye bụkwa onyeisi ndị na-arụrụ ya ọrụ, onyeisioche APGA. Ha were foro ntutu taa, wee sị na ha agaghị anọ na mmiri ncha abanye ha nʻanya.

 

Ebe a na-asị na ọrịa ezughị oke, a sịkwa onye dara ibi too afọ. Osote odeakwụkwọ ndị APGA bụ aazị Jerri Obasị gakwara nʻihu kwo na o nwere nkata nzuzo ụfọdụ mmadụ na-akpa iji mee ka onyeisioche APGA nke aha yabụ Maazị Victor Oye, chịrị gawa. O boro Maazị Oye ebubo wee sị na ya bụ nwaamadị amaghị nke ekwe na-akụ. Maazị Obasị sịkwara na Maazị nwoye bụ onye e jiri ịna ngarị na ime mpụ were mara. O wee kwuo na ha bụ ọkụkọ agaghị esi nʻala felie ma fegoro na mkpụmkpụ aja. Ọ sịkwa na Gọvanọ Obianọ tufuru anya, mee ka ọ naghị ahụ mpụ na ajọ ihe niile na-eme na APGA. O kpọkuziri ndị APGA ka ha chụpụ Oye ma jụkwa Odili.

Leave a Reply