Akụkọ Ụwa

Akajiakụ Femi Odetola Agaala Leta Christian Chukwu na Lọndọnụ

Akajiakụ ji ego achụ ego, Omepụrụonyeọdịịrị, Maazị Femi Odetola, onye nke nyere puku dọla iri ise ($50,000) maka ọgwụgwọ ọrịa Maazị Christian Chukwu, agaala Lọndọnụ ije leta ya bụ onye ọrịa. Maazị Odetola mere mjem nleta a na ntụmadị iji hụ etu Maazị si agbake.

Mgbe o ruru nʻụlọọgwụ ebe Maazị Chukwu nọ na Lọndọnụ, o jiri ohere ahụ were kwuoro ndị dịbịa Bekee dị iche iche bụ ndị na-agwọ Maazị Chukwu. Ọ gwara ndị dibịa Bekee ahụ na Maazị Chukwu bụ odogwu Naịjirịa ji eme ọnụ. Nʻihi ya, ọ rịọrọ ha ka ha hụ na a na-elekọta ya anya etu o kwesiri nʻeleghị ego anya nʻihu.

Mgbe ya na ndị dibịa Bekee ahụ kparịtachara ụka, Maazị Odetola sịrị na obi bụ ya naanị an̄ụrị na ndị na-arụ nʻụlọgwụ ahụ na-elekọta Maazị Chukwu etu kwesiri.

Maazị Christian Chukwu, onye bụbu onyeisi egwuregwu bọọlụ Naịjirịa tupu ọ laa ezumike nka, sịrị na ya amaghị etu ya ga-esi kelewe Maazị Odetola maka ihe o meere ya. O wee rịọ Chineke ka ọ kwụghachi ya ụgwọ ọrụ ya. O kelekwere igwurube ndị Naịjirịa na-ekpere ya ekpere ka ya gbakee ngwangwa.

Leave a Reply