Akụkọ ỤwaIzunna OkaforMmemme

Ndị Ihiala Ejirile Ọñụ Rie Ji Ọhụrụ

Oke ọñụ dara na nsonso a n’obodo Ihiala dị n’okpuru ọchịchị steeti Anambra, dịka ndị obodo ahụ merùbèrè mmemme iri ji ọhụụ ha nke ahọ 2020.
Mmemme Ịwa Ji ahụ e mere n’obi eze ọdịnala obodo ahụ bụ Igwe Thomas Ikenna Obidiegwu dọtàrà ụmụafọ obodo ahụ nọgasị n’ebe dị iche iche, ndị ikwu na ibe, ndị nwadiala, ndị enyi, ndị agbatobi na ndị ọzọ na-echère obodo ahụ ezi echichè.
N’okwu ya oge ọ na-agọ ọjị na mmemme ịwa ji ahụ, Igwe Obidiegwu kelere Chineke maka ọrụ ọma ya n’isi ụmụafọ obodo ahụ, ọkachasị n’ihi ndụ, ngọzị, udo na ọganihu nke o jiri chọọ ha mma, ya na amara o nyere ha, ha wee kọọ ihe n’ubi ma dịkwa ndụ weta ihe ha kọnyèrè n’ubì.O kelekwara aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, maka ụzọ dị iche iche o sigoro nwògharịa ngalaba niile nke steeti ahụ, ọkachasị ngalaba ọrụ ugbo; etu o siri kwàlite ọnọdụ obibi ndụ ụmụafọ steeti ahụ, ma wetekwa ọnọdụ mmepe tọrọ atọ n’ime-ime obodo dị iche iche na steeti ahụ.
O kwezịrị nkwà na Ndị Ihiala ga-aga n’ihu ịkwadò ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ, ọbụladị dịka ọ kpọkukwàrà ụmụafọ obodo ahụ ka ha sonyesie ike na nnwògharị ahụ na-aga n’ihu ugbua na ngalaba ọrụ ugbo nke steeti ahụ, n’ihi na úrù dị n’ọrụ ugbo.

N’okwu nke ya, otu onye n’ime ndị bịara mmemme ahụ, ma bụrụkwa Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na ịkụziri ọhaneze ihe ha kwesiri ịma, bụ Maazị C-Don Adinuba kọwara mmemme ahụ dịka oge e ji enye Chineke ekele maka owuwe ihe ubì, ya na oge e ji akwanyere ji ùgwù dịka eze ihe a kọrọ n’ubì, ma kpakwa maka ọdịmma obodo. O nyere ndị obodo ahụ ndụmọdụ ka ha gaa n’ihu inye ọchịchị Gọvanọ Obianọ nkwàdo ka o wee rụzuo ọrụ ọma ahụ ọ malitegoro na steeti ahụ n’ozuzuokè; ọbụnadị dịka ọ kpere ka Chineke were aka ya họpụta onye ga-anọchi anya Gọvanọ Obianọ site na nhọpụta ọkwa gọvanọ a ga-eme n’ahọ na-abịa abịa.

Ụfọdụ ndị ọzọ kwuru okwu na mmemme ahụ, nke gụnyere Onowu Ihite, bụ Maazị Benson Nwawulu, na Ichie Collins Agbasiere kọwara mmemme iri ji ọhụụ dịka omenala dịbara gboo n’ala Igbo, bụkwa nke e si na ya egosipụta ịma mma nke ọnatarachi Ndị Igbo, ma kpọkuzie ndị Igbo ka ha jigidesie omenala ha ike ma na-emesikwa ya ike, n’ihi na nke ahụ bụ njirimara Igbo.
Ụfọdụ ndị ọzọ sonyere na mmemme ahụ gụnyèrè onyeisioche nchere ogè n’okpuru ọchịchị Ihiala, bụ Maazị Okechukwu Chukwu; onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ Maazị Okechukwu Chukwu, tinyere ụfọdụ ndị ọzọ.
Mmemme ahụ bụ nke e mere n’ịgbasò ntụziaka ahụ gọọmenti maka ọrịa nje korona, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya gbaa egwu ọdịnala dị iche iche, rie ji a hụrụ ahụ na nke e siri n’ụdị dị iche iche, tinyere mmanya ngwọ, nkwụ elu na mmanya ndị ọzọ e jiri lomìé ya, nke mezịrị ka mmemme ahụ zaa aha a kpọrọ ya.

Leave a Reply