Akụkọ ỤwaIzunna Okafor

Onye Omeiwu Anambra, Ọzọbịalụ Amalitela Ịrụ Ụlọ Ahụike n’Ogbodi, Amichi

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a, dịka onye omeiwu ahụ na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo ‘Nnewi South’ nke mbụ n’ụlọ omeiwu steeti Anambra, bụ Maazị Sonny Ozobịalụ malitere ịrụ ụlọ ahụike n’Ogbodi, dị n’Amichi,  n’okpuru ọchịchị ‘Nnewi South’ steeti Anambra.

N’okwu ya na mmemme ahụ, ya bụ onye omeiwu mèrè ka a mara na ịrụ ụlọ ahụike ahụ so n’otù n’ime nkwà o kwèrè oge ọ na-achụ nta nkwàdo, ma mekwa ka a mara na e nweghị ọbụnadị ótù ụlọ ahụike ọbụla dị n’obodo Ogbodi chaachaa, bụ nke mezịrị ka ụmụafọ obodo ahụ na-agabiga ihe nhịahụ iji nweta ọgwụgwọ site n’obodo ndị ọzọ gbara ha gburugburu.
Maazị Ozobialu, onye nọkwara na nsonso a wee malite ọrụ ịgba ògigè na ịrụnyekwu ụlọ n’otu ụlọakwụkwọ dị n’Ọsụmenyi’, gàrà n’ihu mee ka a mara na ọ ga-agbakwa ụlọ ahụike ahụ ògìgè ma tinyesikwa ya akụrụngwa bụ ịgbà ma a rụchaa ya n’ime ọnwa ole na ole na-abịa abịa.
O kèlèrè aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obiano maka ịkwàdò na ịmapụtàra ha bụ ndị omeiwu ego ha ga-eji rụrụ ndị ọgbọ nta nkwàdo ha ọrụ, tinyéré ọrụ ọma ndị ọzọ dị iche iche ya bụ Gọvanọ rụgoro na ngalaba na ngalaba niile nke steeti ahụ, nke megoro ka Anambra bụrụ ejiamaatụ.
Ọ kpọpụtasịrị ihe dị iche iche ya onwe ya bụ Ọzọbịalụ mepụtagòrò dịka onye omeiwu, tinyéré ọrụ ngo dị iche iche ọ rụgoro na mpaghara ebe dị iche iche n’ọgbọ nta nkwàdo ahụ, ma kwuo na ọ ga na-amalite ọrụ ngo na mpaghara ebe dị iche iche n’ọgbọ nta nkwàdo ya kwà ụbọchị Satọdee ọbụla, wee ruo mgbe oge ezumike izuụka isii ha (ná-ágá n’ihu ugbua) bịara na njedobe.
O mere ka a mara na ọrụ ga-amalitekwa ọzọ oge adịghị anya na mpaghara ebe ahụ fọrọ afọ n’okporo ụzọ ahụ siri Ekwulumili gaa Unubi, n’ihi na Gọvanọ Obianọ enyela ntụziaka ka a rụchapụ ya bụ ọrụ, n’ịgbasó okwu ya onwe ya (bụ Maazị Ozobialu) kwùru n’ụlọ omeiwu ahụ bànyere ọnọdụ ụfọdụ okporo ụzọ dị iche iche n’okpuru ‘Nnewi South’, nke okporo ụzọ ‘Chisco—Ogbodi—Osumenyi’ so n’ótù n’ime ha.

O kwezịrị nkwà na ọ ga-aga n’ihu ịnọchite anya ọgbọ nta nkwàdo ahụ nke ọma n’ụlọ omeiwu.
N’okwu nke ya oge ọ na-atọ ntọala ụlọ ahụike ahụ, onyeisioche nchere oge n’okpuru ọchịchị ‘Nnewi South’ bụ Maazị Chieloka Okoye kèlèrè Ozobialu maka ọmarịcha ọrụ ọma dị iche iche  ọ na-arụ, ọkachasị ọrụ ụlọ ahụike ahụ ọ na-arụrụ ndị Ogbodi, ma kpọkuo ya ka o jisie ike n’ọrụ. O mere ka a mara na ndị Ogbodi na-agacha ihe ruru kilomita abụọ tupu ha anata ọgwụgwọ site n’obodo ndị ọzọ gbara ha gburugburu n’ihi na ha enweghị ụlọ ahụike ọbụla n’obodo ahụ.
O kelekwara Gọvanọ Obianọ maka ịgba mbọ hụ na ndị omeiwu sitere ọgbọ nta nkwàdo iri atọ e nwere na steeti ahụ na-enweta ego ọrụ ọgbọ nta nkwàdo ha (bụ ‘constituency project’) na mgbe kwesiri ekwesi iji rụrụ ndị ọgbọ nta nkwàdo ha ọrụ. Ọ kpọkuzịkwara ‘Ndị Nnewi South’ ka ha gaa n’ihu ịkwàdò ọchịchị Gọvanọ Obianọ na otu ndọrọndọrọ ọchịchị ‘All Progressive Grand Alliance’ (APGA) n’ihi na nke kacha mma ka na abịa n’ihu.
N’okwu ha n’otu n’otu na mmemme ahụ, onyeisi ọchịchị obodo Amichi, bụ Maazị Dan Ugwumba nà onyeisi Ogbodi, bụ Maazị Jeremaih Ezechukwu kọwàra Maazị Ọzọbịalụ dịka ‘ekwueme’, ma gbaa akaebe na o nwebeghị mgbe ọ gharịpụrụ ha maọbụ ndị obodo ha n’imezùpụta nkwà o kwèrè ha.
Ha kelekwara ya maka ọrụ ọ rụgoro arụ, ndị nke na-aga n’ihu ugbua nakwa ndị nke ọ ka ga-arụ arụ; kpee ka Chineke gaa n’ihu ịgọzi ya, ọbụnadị dịka ha rịọrọ ya ka ọ gharakwa ịdà mbà n’ọrụ.
Mmemme ahụ dọtara ọtụtụ ndị dị iche iche e ji okwu ha agba ìzù n’okpuru ọchịchị ‘Nnewi South’ nke gụnyere osote onyeisioche okpuru ọchịchị ahụ, bụ Maazị Sunday Okafor; odeakwụkwọ okpuru ọchịchị ahụ, bụ Maazị Adolphus Umeaniba; nnukwu onye enyemaka pụrụ ichè nye Gọvanọ Obiano n’ihe gbasaara ikpe, bụ Maazị Ifeanyị Ezegamba; nnukwu onye enyemaka pụrụ ichè nye Gọvanọ Obiano n’ihe gbasaara nzikọrịta ozi, bụ Maazị Iyke Anagboso; nnukwu onye enyemaka pụrụ ichè nye Gọvanọ Obiano n’ihe gbasaara, bụ Maazị Chika Ibeneme; onye enyemaka pụrụ ichè nye Gọvanọ Obiano n’ihe gbasaara mmekọrịta obodo, bụ Maazị Tochukwu Okonkwo; onye enyemaka pụrụ ichè nye Gọvanọ Obiano n’ihe gbasaara nzikọrịta ozi ọgbara ọhụụ, bụ Maazị Daniel-Scott Oforneme; onye enyemaka pụrụ ichè nye Gọvanọ Obiano n’ihe gbasaara ICT, bụ Maazị Odichukwu Okonkwo, ụkọchukwu ụka Angịlịkan n’Ogbodi, bụ ‘Rev.’ Richard Ibeto, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ ọnụ na-eru n’okwu.

Leave a Reply