Akụkọ ỤwaIzunna Okafor

Gọọmenti Anambra Agbapeela Akụrụngwa Ọhụrụ n’Ụlọọgwụ Enugwu-Ukwu

N’ịgbaso nke a, gọọmenti steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee gbapee ọmarịcha akụrụngwa ahụike ọhụụ (bụ ‘Ultrasound Machine’) na akụrụngwa e ji esi n’ike anyanwụ adọta ọkụ (bụ ‘Solar Energy System’) e butèrè n’ụlọ ahụike ọhaneze dị n’Enugwu-Ukwu, dị n’okpuru ọchịchị Njikọka.
Akụrụngwa ọhụụ niile ahụ bụ nke a gbapèrè site n’aka osote Gọvanọ steeti ahụ, bụ Dọkịta Nkem Okeke. N’okwu ya oge ọ na-agbape akụrụngwa ahụ, Dọkịta Okeke mèrè ka a mara na ọchịchị steeti ahụ agaghị ada mbà n’ịkwalite ọnọdụ obibi ndụ na ọnọdụ ahụike ụmụafọ steeti ahụ, ọkachasị site n’atụmatụ ọrụ ahụike ‘Anambra State Health Insurance Agency’ (ASHIA).
O mere ka a mara na ọ bụ ụlọọrụ ASHIA bunyèrè ụlọ ahụike ahụ akụrụngwa ahụ, ma kọwaa na akụrụngwa ndị ahụ gà-enye aka ịkwàlite etu ọrụ si aga n’ụlọ ahụike ahụ. O kwere nkwà na gọọmenti ga-aga n’ihu inye ụlọ ahụike ndị ọzọ dịgasị na steeti ahụ ezi nkwàdo zuru òkè.
N’okwu ya na mmemme ahụ, onyeisi ụlọọrụ ASHIA, bụ Dọkịta Simeon Onyemaechi kwuru na ebumnobi e jiri guzobe ya bụ ụlọọrụ bụ ka e were nye ụmụafọ steeti ahụ ezi ọnọdụ ahụike bụ ịgbà n’ọnụ ego dịkarịchara àlà.
O kwuru na ụlọọrụ ahụ ga-ebunyekwa ụlọ ahụike ọhaneze dịgasị na steeti ahụ akụrụngwa nke ha, ma kpọkuo ndị edebànyèbèghị aha n’atụmatụ ASHIA ka ha gbaa mbọ mee nke ahụ ọsọsọ, ma debanyekwa nke ndị ezinụlọ ya na nke ndị ọzọ enweghị ego idebanye ahà ha.

Onyeisi ụlọ ahụike ahụ, bụ Dọkịta William Onwuocha kèlèrè ụlọọrụ ASHIA na gọọmenti Anambra maka ezi nkwàdo ha, ma rịọkwazie ka a gaa n’ihu inye ụlọọgwụ ahụ nkwàdo n’ihe ndị ọzọ na-akpa ha.
Kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ, bụ Dọkịta Vincent Okpala, na ụfọdụ ndị ọzọ selitere isi na ngalaba ahụike na steeti ahụ sònyèrè na mmemme ahụ.

Leave a Reply