Ụwandịigbo Enweela Ọgbakọ Ahọ 2020, Kpọọ Òkù Nkwàlite Asụsụ Igbo
Buusu sị na ọ bụ mmekọrịta ahụ bụ ụtọ nwanne, ebe ndị Igbo kwùrù na ọ na-abụ a gbakọọ aka ọnụ wee buo ozu enyi, ọ dị mfe.N’ịgbaso nke a, ndị Igbo asụsụ na omenala Igbo na-amasị nọrọ na nsonso a wee nwee nnukwu ọgbakọ izugbe pụrụ iche iji tụgharịkọta uche ọnụ banyere ọnọdụ asụsụ na omenala Igbo, ma tụkwa arò etu a pụrụ isi kwàlite ma mee ka ha […]