Ndị Enugwu-Agụleri Emeela Olili Ọbịbịa Eri Nke Ahọ 2020

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a, dịka ndị obodo Enugwu-Agụleri dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Anambra East’ nke steeti Anambra merùbèrè mmemme Oriri Ọbịbịa Eri, bụ otu nnukwu mmemme ọdịnala pụrụ ichè e jiri mara obodo ahụ.Ya bụ mmemme bụ nke ndị obodo ahụ na-eme kwà ahọ ọbụla, ma bụrụkwa nke ha sitèrè na ya na-akwanyere nnukwu nna mụsàrà ha ùgwù, bụ Eri, ónyé bụ nwa mbụ […]

Obianọ Atọọla Ntọala Ụlọọgwụ Nlekọta Akụrụ Na Nnewi

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ agbapeela ọrụ iguzòbe ụlọọgwụ ebe a ga na-elekọta akụrụ (kidney) mmadụ na Nnewi, dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Nnewi North’ nke steeti ahụ.Ya bụ nnukwu ụlọọgwụ bụ nke a na-arụ site n’aka otu onye nnọrọonwe, bụ Dọkịta Okey Chidolue, ma bụrụkwa ebe a ga na-agwọ ma na-elekọta ụdị ọrịa akụrụ dị iche iche, ma ihe gbasaara inyòchà, ịgbanwògharị na itinyegharị akụrụ.N’okwu ya […]

Ọnọdụ Nchekwa: Gọọmenti Anambra Na Ndị Keke Enweela Ọgbakọ

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor

Ọchịchị steeti Anambra nọrọ ụbọchị Wenezdee wee nwee ọgbakọ, ha na ndị na-anyà ụgbọala Keke Napep n’ime steeti ahụ.Ya bụ ọgbakọ bụ nke weere ọnọdụ n’ama egwuregwu Alex Ekwueme dị n’Awka, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee tụlee ma tinye okwu ọnụ banyere ihe metụtara òtù ahụ, mpụ na arụrụala, nakwa ọnọdụ nchekwa steeti ahụ.N’okwu ya n’ọgbakọ ahụ, odeakwụkwọ izugbe steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelu gbarụrụ ihu […]

Ngagharịiwe: Ndị Omekeome Amụnyela Legọọsị Ọkụ

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor

Ụlaga sị na ọ bụrụ na ya apịaghị ụtàrị, ụmaka anaghị ama na ya bụ mmanwụ.Ka ọ dị taa, ọ na-akpọtụ akpọtụ ugbua ma na-ekwo èkwò na steeti Lagos na ụfọdụ steeti dị iche iche, dịka ndị na-eme ngagharị iwe a na-enyo enyo na ha bụ ndị omekeome jiri iwe wee gbaa ọtụtụ ụlọọrụ na ihe ndị ọzọ dị iche iche ọkụ. Ndị ahụ a na-enyo ènyò na ha bụ ndị […]

E Liela Ozu Nna Chimamanda Adichie n’Abba

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor

Ọnwụ bụ eze a ma na a ga-echi ma bụrụkwa ihe na-echere mmadụ ọbụla dị ndụ, kama, ihe kacha mkpa bụ ihe onye ahụ mepụtara n’ụwa wee nwụọ, na ebe mkpụrụ obi ya na-aga ịnọ ọnọdụ ikpeazụ. Nke a bụ isi sekpụ ntị n’okwuchukwu Bishọọpụ Jonas Benson Okoye nke ụka katọliiki na dayọsis Awka, na mmemme elimozu Ọkammụta James Nwoye Adịchie, bụ nna otu nwaanyị na-ewu èwù n’ide akwụkwọ na […]

Ọba Akwụkwọ Anambra Na Òtù Nnọrọonwe Emeela Ụbọchị Nwata Nwaanyị

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor

A kọwaala mkpà ọ dị ịkwàlite ụmụaka nwaanyị ịgụ akwụkwọ nke ọma, ma kpọkwa òkù ka e bèlata otu e si emekpà ụmụaka ụmụnwaanyị ahụ nakwa etu e si akpachàpụ ha n’akụkụ n’ụzọ ezighị ezi.Nke a bụ isi sekpụ ntị ma bụrụkwa okwu a kpụ n’ọnụ na mmemme imerùbè ụbọchị nwata nwaanyị na mba ụwa (nke ahọ 2020), bụ nke a chịkọbàrà site n’aka ọba akwụkwọ steeti Anambra bụ ‘Prof. […]

Òtù Nnọrọonwe Ebunyela Ụlọ Ahụike Mahadum COOU Akụrụngwa Ahụike

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor

Òtù nnọrọonwe sitere mba ofesi nọrọ na nsonso a wee jiri akụrụngwa ahụike dị iche iche kwàdo ụlọ ahụike nkuzi mahadum Chukwuemeka Ọdụmegwu Ojukwu dị n’Awka, na steeti Anambra.Akụrụngwa dị iche iche ndị òtù ahụ bunyere ụlọ ahụike mahadum ahụ gụnyere karama mmanụ nkwọchasị aka bụ sanịtaịza, karama bliichi (bleach), nkùkù a na-akwụba akwụba (standing fan), oche, tebulu, na ihe ndị ọzọ.Oge ọ na-enyefè ihe ndị ahụ n’aka ụlọ ahụike […]

Ndị Amawbịa Bi Na USA Ekesàárala Ụmụafọ Obodo Ahụ Ihe Nkwàdo

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor

Òtù ahụ jikọtara ụmụafọ Amawbịa bi na mba USA nọrọ na nsonso a wee bukọta ma kesàárá ndị dị iche iche ihe na-esiri ike n’obodo ahụ ihe nkwàdo dị iche iche.Ihe nkwàdo a bụ nke mmadụ ruru narị isii n’ọnụọgụgụ ihe na-esiri ike n’obodo ahụ kètàrà, ma bụrụkwa nke ebumnobi ya bụ iji belatara ụmụ mmadụ agụụ na ihe iche aka mgba ndị ọzọ ha na-agabiga n’ihi ọrịa nje korona. […]

Njekoro: Ụlọọrụ ‘Procter & Gamble Ltd’ Ebunyela Gọọmenti Anambra Ihe Mkpuchi Ọtọ Ụmụaka

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor

Igbo sị na ọ bụ ihe nnekwu ọkụkọ nwere ka o ji emere okeọkpa ọgọ, ma sịkwa na ọ na-abụ e jikọọ aka buo ozu enyī, ọ dị mfe.N’ịgbaso nke a, ótù ụlọọrụ nnọrọonwe a maara dịka ‘Procter And Gamble Limited’ ebunyela gọọmenti steeti Anambra ihe e ji awàchi ụmụaka íkè (bụ ‘pampers’ n’asụsụ bekee), nke ọnụọgụgụ ya ruru otu narị puku na iri abụọ, ka e késàárá ụlọ ahụike […]

A Kpọkuola Ndị Anambra Ka Ha Na-Edobe Ọwà Mmiri Ha Ọcha

Posted Leave a commentPosted in Akụkọ Ụwa, Izunna Okafor

Ọ na-adị mma ịma ọkwa mmiri tupu ozuzo ya, ma na-akakwa mma iji ehihie wee chụba ewu ojii, maka na chi jie ọ hịa ahụ njide.Ọ bụ n’ịgbaso nke a ka gọọmenti steeti Anambra jiri kpọọ òkù ọzọ ma dụọ ụmụafọ steeti ahụ ọdụ ka ha na-edebe ọwà mmiri ha ọcha, ma kwụsị iji unyi, atịtị na ihe ndị ọzọ dị etu ahụ were na-emetọ maọbụ na-asụchisi ọwà ọwà mmiri […]