Akụkọ ỤwaIzunna Okafor

Obianọ Atọọla Ntọala Ụlọọgwụ Nlekọta Akụrụ Na Nnewi

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ agbapeela ọrụ iguzòbe ụlọọgwụ ebe a ga na-elekọta akụrụ (kidney) mmadụ na Nnewi, dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Nnewi North’ nke steeti ahụ.Ya bụ nnukwu ụlọọgwụ bụ nke a na-arụ site n’aka otu onye nnọrọonwe, bụ Dọkịta Okey Chidolue, ma bụrụkwa ebe a ga na-agwọ ma na-elekọta ụdị ọrịa akụrụ dị iche iche, ma ihe gbasaara inyòchà, ịgbanwògharị na itinyegharị akụrụ.
N’okwu ya na mmemme ịtọ ntọala iwu ụlọ ahụike ahụ, Gọvanọ Obianọ, nke onye nọchitere anya ya na mmemme ahụ bụ Kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ, bụ Dọkịta Vincent Ọkpala kèlèrè nwa amadi ahụ na-arụ ụlọọgwụ ahụ, bụ Dọkịta Chidolue maka ọmarịcha atụmatụ ahụ, bụ nke o kwuru na ọ ga-enye aka ịgwọ na ibèlata nsogbu ọrịa akụrụ na-emekpa ụmụ mmadụ ahụ n’ụdị dị iche iche, ma na steeti Anambra, ma n’ala Nigeria, ma na mba ụwa n’izùgbe.

O kwupụtara obi ụtọ ya banyere etu ndị mmadụ si aña ntị ma na-aza ọkpụkpọ òkù akụ ruo ụlọ ahụ ha na-akpọ ka ụmụafọ steeti ahụ wèlataruo ma wunye akụnụba ha na steeti ahụ, maka na ọ na-abụ akụ ruo ụlọ, a mara onye kpara ya. Ọ kpọkuru ndị ọzọ bụ ndị Anambra ji ego achụ ego n’ebe dị iche iche ka ha welataruo akụ ha ụlọ, n’ihi na nke ahụ ga-enye aka ime ka Anambra bụrụ ejiamaatụ ma gakwa n’ihu ịbụ ebe nlegara anya n’ihe gbasaara ọnọdụ akụnụba na ọnọdụ mmepe n’ala Nigeria.
Ọ kpọpụtasịrị ihe dị iche iche ọchịchị steeti ahụ mepụtagoro na ngalaba ahụike steeti ahụ iji kwàlite ezi ọnọdụ ahụike ụmụafọ steeti ahụ, ọkachasị site n’okpuru atụmatụ nchekwa ahụike steeti ahụ bụ ‘Anambra State Health Insurance Scheme (ASHIA)’ nakwa site n’inwogharị ngalaba ahụike steeti ahụ n’izugbe.N’okwu nke ya, onye na-ewu ụlọ ahụike ọhụụ ahụ, Dọkịta Chidolue kọwara na ebumnobi o jiri bagide n’ọrụ ahụ bụ iji metụ ndụ ụmụ mmadụ aka n’ụzọ dị mma ma belatakwa ihe isiike ụfọdụ n’ime ha na-agabiga, ọkachasị dịka o siri metụta ọnọdụ ahụike na akụrụ ha.
O kwuru na a ga-arụchapụ ọrụ ahụ n’ime ọnwa iri na abụọ na-abịa abịa, ma sịkwa na nke ahụ ga-enyekwa aka ikewàpụtàrà ụmụafọ steeti ahụ ohere ọrụ ma ọ bụrụ na a rụchaa ya; nyekwa aka belata ndị mmadụ ịgbaje mba ofesi oge ọbụla ịchọ ọgwụgwọ maọbụ ilekọta ọnọdụ ahụike ha anya.
Ndị dị iche iche sonyere na mmemme ahụ gụnyèrè, bụ onye ojide ego otu jikọtara ndị ọrụ ahụike n’ala Nigeria, bụ Dọkịta Azuka Anazodo; eze ọdịnala Nnewi, bụ Igwe Kenneth Orizu, nke Obianefo Orizu nọchitere anya ya, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ ọnụ na-eru n’okwu, ma na ngalaba ahụike, ma na ngalaba ndị ọzọ dị iche iche na steeti ahụ.

Leave a Reply