Akụkọ ỤwaIzunna Okafor

Ndị Enugwu-Agụleri Emeela Olili Ọbịbịa Eri Nke Ahọ 2020

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a, dịka ndị obodo Enugwu-Agụleri dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Anambra East’ nke steeti Anambra merùbèrè mmemme Oriri Ọbịbịa Eri, bụ otu nnukwu mmemme ọdịnala pụrụ ichè e jiri mara obodo ahụ.
Ya bụ mmemme bụ nke ndị obodo ahụ na-eme kwà ahọ ọbụla, ma bụrụkwa nke ha sitèrè na ya na-akwanyere nnukwu nna mụsàrà ha ùgwù, bụ Eri, ónyé bụ nwa mbụ nke Gad, otu n’ime ụmụ Jekọb (Jacob) dịka ọ dị n’akwụkwọ nsọ, bụkwa onye e kwenyere na ọ bụ ya mụsàkwàrà Ndị Igbo, n’ụwa gbaa gburugburu, ma bụrụrụkwa nnukwu nna-nna ha.

Nnukwu mmemme ahụ wèèrè ọnọdụ n’obí eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Eze Chukwuemeka Eri, bụkwa onye nọ n’isi mmemme ahụ. Ọtụtụ ụmụafọ obodo ahụ na dị iche iche e ji okwu ha agba ìzù na steeti Anambra na mpụga ya sonyèkwàrà na mmemme ahụ.
A màlitère ya bụ mmemme site n’ịbagide ịga njem nleta nke eze ọdịnala obodo ahụ gara n’ebe a na-akpọ Agbanabọ Ezu na mmiri Ọmambala n’ihe dịka elekere ise nke ọnụ ụtụtụ, bụ ebe nnukwu nna-nna ha ahụ bụ Eri kwụsịrị tupuu o wee bàta ka o biri n’ala ahụ a maara taa dịka Agụleri. Ọ nọkwazịrị n’ebe ahụ kpee ekpere, jụchaa àlà, ma chụfuo ihe ọjọọ n’obodo ahụ, na n’isi ụmụafọ Eri niile.
Oge ọ na-agọ ọjị na mmemme ahụ, ya bụ eze ọdịnala kpekwazịrị ekpere ngọzị, ọganihu, nchekwa, ahụike, ogologo ndụ na ihe akụakụ na ihe enweenwe n’isi ụmụafọ obodo ahụ niile nọgasị ebe dị iche iche.
Ya bụ mmemme dọtàrà ndị eze ọdịnala dị iche iche emume ọdịnala ahụ metụtara, nke gụnyere eze ọdịnala Aguleri, bụ Eze Michael Idigo; eze ọdịnala Eziagulu Otu Aguleri, bụ Eze Lawrence Nwofia; eze ọdịnala Mkpunando Aguleri, bụ Eze Johnson Mbanefo.Ndị eze ọdịnala ahụ, n’okwu ha n’otu n’otu, mèrè ka a mara na ha na-esonye ma na-abịakọta ọnụ na mmemme ahụ kwà ahọ ọbụla, iji sọpụrụ ma kwanyere nnukwu nna ha bụ Eri ùgwù etu o siri kwesi, dịka onye mụsàrà Igbo niile. 
Ha kwukwara na ha na-ahụta mmemme ahụ dịka ihe nke mmụọ, ma kọwaa na njem ahụ a bagidere na mmiri ahụ bụ iji kpọlite mmụọ nna ha bụ Eri. Ha kpọkukwazịrị onye ọbụla bụ ezi nwaafọ Igbo ka ọ na-akwàdó njirimara na omenala ya ike, maka na ezi omenala kwesiri ịbụ nwata tote o tokwuru.
Ndị dị iche iche kwuru okwu na mmemme ahụ gụnyèrè onyeisioche Ojiana Ụnọ Aguleri, bụ Ichie Okechukwu Dibua; onyeisioche nchere oge n’okpuru ọchịchị ‘Anambra East’, bụ Maazị Obi Nweke; onyeisioche òtù ‘Aguleri National Youth Association (ANYA)’ bụ Maazị Nnamdi Ikeli-Adimora, tinyere ụfọdụ ndị ọzọ.
A nọrọ na mmemme ahụ gbaa egwu mmanwụ na egwu ọdịnala ndị ọzọ dị iche iche, ñụọ ma rikwa gwoogwoo nke mere ka ya bụ emume zaa aha a kpọrọ ya.

Leave a Reply