Ụlaga sị na ọ bụrụ na ya apịaghị ụtàrị, ụmaka anaghị ama na ya bụ mmanwụ.
Ka ọ dị taa, ọ na-akpọtụ akpọtụ ugbua ma na-ekwo èkwò na steeti Lagos na ụfọdụ steeti dị iche iche, dịka ndị na-eme ngagharị iwe a na-enyo enyo na ha bụ ndị omekeome jiri iwe wee gbaa ọtụtụ ụlọọrụ na ihe ndị ọzọ dị iche iche ọkụ. Ndị ahụ a na-enyo ènyò na ha bụ ndị omekeome bụ ndị a mabụ dịka ndị na-eme ngagharị iwe ma na-agwa gọọmenti ka a màchie ngalaba ụlọọrụ uweojii ahụ pụrụ iche a maara dịka ‘Special Anti Robbery Squard’ (bụ ‘SARS’ n’aha ịchafụ) n’ihi ajọ ọrụ ha na-arụ, nakwa etu ha si egbusi ụmụ mmadụ dịka ọkụkọ, tinyéré etu ndị ọrụ nchekwa si emekpà ụmụ mmadụ ahụ.
Ngagharị iwe a ndị ahụ na-eme bụkwa nke ha si na ya wee na-akpọkwa òkù ka gọọmenti mezigharịa ọtụtụ ihe dị iche iche anaghị aga nke ọma n’ala Nigeria. Mgbe ya bụ ngagharị iwe malitère, onyeisi ndị uweojii n’ala Nigeria, bụ IGP Adamu Mohammed gbasoro ọkpọkpọòkù ahụ a na-akpọ; o wee màchie ya bụ ụlọọrụ SARS ma guzobekwa ụlọọrụ ọhụụ ọzọ, nke ọ kpọrọ ‘Special Weapons And Tactics’ (SWAT) maka ịnọchi anya ‘SARS’.
Nke a mezịrị ka iwe wee ụmụ mmadụ, n’ihi na ọ dị ka a ga-asị na ọ mara ụma machie SARS ma jiri aghụghọ bàgharịa ha aha ọhụụ, bụ SWAT. Ọ bụ ihe doro anya na a bagharịgodi Omenka aha ọzọ, ihe o jiri bụrụ Omenka ka dịkwa ya n’ime; maka na onye rere nkịta zụrụ bùúsù, ihe ntukwù ka nọkwa be ya.
N’ihi nke ahụ, ndị a gakwara n’ihu na-eme ngagharị iwe ahụ, ma na-akpọkwa òkù ka a machie ma SARS ma SWAT, ma mekwa ihe ndị ọzọ ha na-arịọ gọọmenti ka o mee iji nwògharịa ọnọdụ ala Nigeria.Ya bụ ngagharị iwe na-agakwa n’ụzọ udo, ma bụrụkwa nke ọtụtụ ụmụafọ Nigeria (ọkachasị ndị ntorobịa) ma ndị nọ na mba ofesi dị iche iche iche na-esonyesi ike na ya. Ọtụtụ steeti dị iche iche n’ala Nigeria na-emekwa ngagharị iwe ahụ, ma isi ala Nigeria, bụ FCT, Abuja.
Ka o sila dị, ya bụ egwu dàghàrịzịrị mgbe ụfọdụ ndị omekeome malitezịrị isi n’okpuru usoro ngagharị iwe ahụ wee na-emezị ụfọdụ ihe dị iche iche adabaghị adaba n’ebumnobi e ji eme ngagharị iwe ahụ. Ihe ndị ahụ gụnyere itiwa ụlọ mkpọrọ dị na steeti Benin (nke mezịrị ka ndị mkpọrọ niile nọ n’ebe ahụ nwere onwe ha ma rie mbọmbọ ọsọ), ya na ịgba ogige ndị uweojii ọkụ na steeti Lagos. E bokwara ebubo na ndị ahụ na-eme ngagharị iwe na-akpa aghara.
Nke bụ ebelebe gbuzịrị n’abalị ụbọchị Tuzdee na Lagos, dịka ndị ọrụ agha ala Nigeria jere n’ebe ndị ahụ na-eme ngagharị iwe nọ na Lekki, steeti Lagos, wee kwụghepụ égbè ha, wee gbaa ụmụ mmadụ tọọtọọ, bụ ndị ntorobịa aka ha dị ọcha nọọrọ onwe ha ebe ha na-eme ngagharị iwe n’ụzọ udo, n’ejighị egbe maọbụ ihe agha ọbụla, ma ya fọdụzie ịchọ onye ọbụla okwu.
Eleghị anya égbè ahụ a gbara ndị ahụ bụ maka ụfọdụ ihe ahụ ndị omekeome megoro n’okpuru usoro ngagharị iwe ahụ, bụ itiwa ụlọ mkpọrọ, ịgba ogige ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ, na ụfọdụ ihe ndị ọzọ e boro ha na ha mere. Ọtụtụ mmadụ n’ime ndị ahụ na-eme ngagharị iwe ahụ tụfùzịrị ndụ ha ụbọchị ahụ n’ihi égbè ahụ a gbara, ebe ọtụtụ nwetakwara ihe mmerụahụ. Nke bụ nsogbu wee daa.
N’ihi ihe ndị ahụ niile na-ekwo, aka na-achị steeti Lagos, bụ Babajide Sanwo-Olu tizịrị iwu onye apụtakwala iro; ya bụ onye ọbụla chịkpuo ụkwụ n’ụlọ ma nọrọ be ya. O kwukwara na o nweghị onye ọbụla nwụrụ maọbụ tụfuo ndụ ya n’égbè ahụ a gbara ndị na-eme ngagharị iwe ụbọchị Tuzdee.
Ihe ndị a niile mezịrị ka iwe na ọnụma jupụta ụmụ mmadụ obi. Ya mere, ka o ruzịrị ụbọchị Wenezidee, nke bụ nsogbu wee daa na Lagos. Ndị ntorobịa, ndị a pụghị ịkọwa ma ha ọbụ ndị na-eme ngagharị iwe ka ha ọ bụ ndị omekeome, jìrì iwe wee gbaa ọtụtụ ụlọọrụ na ebe dị iche iche ọkụ na steeti ahụ, ihe niile ahụ wee gbaa pịapịa, n’agbanyeghị na gọọmenti steeti ahụ tiri iwu onye apụtakwala iro. Nke a pụtara na ha jiri iwe mụnye Lagos ọkụ.
Ebe dị iche iche ndị ahụ gbara ụbọchị Wenezdee gụnyere ụlọ mgbasa ozi ‘Television Continental’ a maara dịka TVC; ụlọọrụ ụgbọala na-ebu ndị njem, bụ ‘Bus Rapid Transit’ a maara dịka BRT; ụlọọrụ na-ahụ maka ije awele okporo ụzọ, bụ ụlọọrụ ‘Federal Road Safety Corps (FRSC)’, ụlọọrụ ‘Nigeria Ports Authority (NPA)’; ụlọ Gọvanọ steeti ahụ, bụ Sanwo-Olu na ụlọ nne ya; ụlọ ahụike ahụ ekweghị enye ndị ahụ na-eme ngagharị owe a gbara egbe ụbọchị Tuzdee ọgwụgwọ oge e buru ha bịa ebe ahụ, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ a gbara ọkụ na Lagos na steeti ndị ọzọ dị iche iche. Ha wakpòkwàrà ụlọ Ọba Lagos, Ọba Rilwanu Akiolu, nke mezịrị ka ndị ọrụ agha gbaa ya okirikiri ma duru ya pụọ, tupu ha ememìlaa ndụ ya. Ha mụnyezịkwara ụlọ ya ọkụ, o wee gbaa pịapịa.
A mụnyekwara ụlọọrụ ndị uweojii na ụfọdụ ihe ndị ọzọ ọkụ na mpaghara ebe ndị ọzọ dị iche iche n’ala Nigeria, dịka steeti Edo, steeti Imo, steeti Ebonyi, nakwa isi obodo ala Nigeria, bụ Abụja, tinyere ụfọdụ ebe ndị ọzọ, n’ihi ngagharị iwe ahụ.Ihe ndị a bụ n’ihi etu gọọmenti siri meso ndị ahụ na-eme ngagharị iwe na ihe ha na-arịọ ka e mee.
Nke a mezịrị o jiri dị mkpà na gọọmenti ga-aña ntị n’ọkpụkpọ òkù ndị a na-eme ngagharị iwe na-akpọ, ma tụpụta usoro kacha mma ha ga-esi leba anya n’ihe ụmụ mmadụ na-ekwu ka e mee, iji belata nsogbu ahụ ịgbasawanye karịa etu ọ dị ugbua, maka na o si ugbua dị mma, ọ dịbara gboo.Onye a gwara kwe, a hụ ọzọ, a gwakwa ya; mana onye a gwara agwa ma ọ nụghị anụ, o mee emee ọ hụ ahụ. Ọ na-abụ nwata ghụọ aka n’ikè, dụọ n’iré, ọ mara na nsị na-atọ ka ya. E mee ngwangwa, e meghara ọdachi.