Akụkọ ỤwaIzunna Okafor

Ndị Amawbịa Bi Na USA Ekesàárala Ụmụafọ Obodo Ahụ Ihe Nkwàdo

Òtù ahụ jikọtara ụmụafọ Amawbịa bi na mba USA nọrọ na nsonso a wee bukọta ma kesàárá ndị dị iche iche ihe na-esiri ike n’obodo ahụ ihe nkwàdo dị iche iche.
Ihe nkwàdo a bụ nke mmadụ ruru narị isii n’ọnụọgụgụ ihe na-esiri ike n’obodo ahụ kètàrà, ma bụrụkwa nke ebumnobi ya bụ iji belatara ụmụ mmadụ agụụ na ihe iche aka mgba ndị ọzọ ha na-agabiga n’ihi ọrịa nje korona. Ihe dị iche iche e kesààrà ndị ahụ gụnyèrè àkpà osikapa, àgwà, igbe nri noduul, tomatò, mmanụ ọpụpa na ego, tinyere ihe ndị ọzọ.
Ihe ndị ahụ bụ nke a tụkọtara site n’aka ụmụnwoke, ụmụnwaanyị, na ndị nwadiala Amawbịa bi mbà USA, ma bụrụkwa nke e kesàrà ndị dị ichie iche sitere ime ogbè isii e nwere n’obodo ahụ, tinyere ụfọdụ ndị abụghị ụmụafọ Amawbịa bi n’obodo ahụ.

N’okwu ya na mmemme ikesà ahụ, eze ọdịnala obodo ahụ bụ Igwe Nnaemeka Nworah-Muolokwu kelere ndị butere ha, maka ichètà ndị ihe na-esiri ike n’obodo ahụ, na igosi ha ịhụnanya site n’iwèlàtàrà ha ihe nkwàdo ahụ. Ọ kọwara mkpà ọ dị na onye nọ n’ụzọ ijè na-eme ọ nọgide, o cheta ndị nọ n’ụlọ. 
Ọ kpọkùkwàzịrị ndị ọzọ bụ ndị aka ji akụ na ndị ihe dịịrị mma, ka ha na-agba mbọ na-enyerịtara ndị ọnọdụ adịcharaghị mma aka, maka na ọ bụ mmadụ bụkwanụ chi ya ọ hụrụ anya. O kpekwara ekpere ka Chineke gaa n’ihu ịgọzị ụmụafọ obodo ahụ maka ezi ntụnye na nkwàdo ha, ma kpọkuo ha ka ha jide ka ha jì.
N’okwu nke ya, onyeisi ọchịchị ‘Amawbia Town Union’ bụ Maazị Ebele Nwufo kọwara nkwàdo ahụ dịka ezi ngosipụta ịhụnanya na obi nwanne, ma kwuo na ọ na-abụ akụ ruo ụlọ, a mara onye kpara ya. Maazị Nwufo, nke ọ bụ Maazị Chukwukadibia Nathaniel gwara ndị ketara òkè n’ihe nkwàdo ahụ ka ha jìkwaa ma mara mee ihe ha kètàrà, ma dụọ ndị esoghị kèta n’àgbà nkwàdo nke a ka ha nwee ndidi, maka na ha pụrụ ikètà okè n’ihe nkwàdo ndị ọzọ na-abịa n’ọdịnihu.
N’okwu ha n’ótù n’ótù, ụfọdụ ndị soro keta òkè n’ihe nkwàdo ahụ, nke gụnyere Maazị Matthew Enukorah, na Oriakụ Chinyere Okechukwu kèlèrè ndị buteere ha ihe ahụ, ma kpee ka Chineke kwụghachi ma gọzie ha mmaji kwuru mmaji.

Leave a Reply