Akụkọ ỤwaIzunna Okafor

Obianọ Agbapeela Amụmà Ọrụ Ugbo Ọkọchị N’Anambra

Igbo sị na ọ na-abụ e jide ibe ji n’aka, a sàá agụụ okwu; maka na ọ na-abụ onye rie, ọ mụrịa.
Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ nọrọ ụbọchị Wenezdee wee gbapee amụmà ịkọ ọrụ ugbo ọkọchị nke ahọ 2020 n’ime steeti ahụ.
Mmemme ịgbape amụmà ọrụ ugbo ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ama egwuregwu Alex Ekwueme dị n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ, ma bụrụkwa nke ọtụtụ ọrụ gọọmenti, ndị ọrụ ugbo, nakwa ọzọ ndị e ji okwu ha agba ìzù na ngalaba dị iche iche na steeti ahụ sonyere na ya.

N’okwu ya oge ọ na-agbape ya bụ amụmà ọrụ ugbo, Gọvanọ Obianọ mère ka a mara na ọrụ ugbo so n’otu ihe ọchịchị ya kacha etinye uchu na ya, ma kpọpụtasịkwa ihe dị iche iche ọchịchị ya megoro na ngalaba ọrụ ugbo steeti ahụ kemgbe ọ batara n’ọkwa ọchịchị. Ọ kọwara ọrụ ugbo dịka ihe bara oke uru ma dịkwa oke mkpà na mmepe obodo ọbụla, n’ihi na ọ bụghị naanị na ọ na-enye ego, kama na ọ na-emekwa ka nri na-adị gbàànyụụ oge ọbụla, ma na-akwàlitekwa mmepe obodo.

O kwuru na ya bụ amụmà ịkọ ọrụ ugbo ọkọchị ga-enye aka ime ka a na-akọpụta nri gwòògwòò na steeti ahụ, ọbụladị ma ugbua a banyegoro n’oge ọkọchị. 
Ya bụ Gọvanọ nọkwazịrị na mmemme ahụ wee kesàá ego mgbazinye maka ịkọ ọrụ ugbo ahụ sitere n’aka gọọmenti etiti nyégara ndị soro rite uru na ya n’ime steeti ahụ, maka ịkwàlite ọrụ ugbo ha.

Ya bụ ego mgbazinye bụ nke dị ijeri naịra abụọ ma bụrụkwa nke e kesààrà mmadụ ruru puku isi n’ọnụọgụgụ.
A nọkwara na mmemme ahụ wee kesàá ihe dị iche iche e ji akọ ugbo nyegara ndị ọrụ ugbo steeti ahụ.

Leave a Reply