Mmemme

Ndị Nimo Eriele Ji Ọhụrụ, Kpọọ Òkù Nkwalite Asụsụ Na Omenala Igbo

Si n’aka Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a, dịka ndị obodo Nimo, dị n’okpuru ọchịchị Njikọka nke steeti Anambra merùbèrè otu oke mmemme e jiri mara ndị Igbo, bụ mmemme iri ji ọhụụ ha nke ahọ 2020.

Ya bụ mmemme a kpọrọ Ịwa Ji Nimo bụ nke weere ọnọdụ n’obi eze ọdịnala obodo ahụ, dị n’okpuru ọchịchị Njikọka nke steeti Anambra, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee kọwaa mkpa ọ dị ichekwaba na ịkwàdo njirimara, asụsụ na omenala Igbo, ọkachasị n’ebe ụmụ na-eto eto nọ, iji hụ na ọ nwụghị maọbụ fuo.

N’okwu ya oge ọ na-awa ji kpọmkwem na mmemme ahụ, eze ọdịnala Nimo, bụ Igwe Maxi Ike Oliobi kelere Chineke maka iji ndụ, ngọzị, ahụike, udo na ọganihu tọrọ àtọ wee chọọ obodo ahụ na ụmụafọ ya mma. O gọrọ ọfọ ihe akụ-akụ na ihe enwe-enwe n’isi ụmụafọ steeti ahụ, ma kpee ka Chineke gaa n’ihu ịgọzi ala obodo ahụ na Ndị Nimo, ma ndị nọ n’ụlp ma ndị nọ n’ụzọ ijè.

Dịka ọ na-ekwe nkwà na ọ ga-aga n’ihu idu obodo ahụ nke ọma, Igwe Oliobi kpọkuzịrị ụmụafọ obodo ya ka ha gaa n’ihu ịgbaso udo na ịhụnanya, ma zèére ihe ọbụla nwere ike ibi ọnọdụ udo na-achị n’obodo ahụ aka ọjọọ, n’ihi na udo na-akwalite ọganihu, ebe ọgbaaghara na katakata na-adọghachi obodo azụ.

Na ntụnye nke ya, onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Njikọka nke abụọ n’ụlọ omeiwu steeti Anambra, bụ Maazị Pete Ibida kpọkùrù Ndị Anambara na ndị Igbo n’izugbe, ọkachasị ndị ntorobịa ka ha tinye uchu n’ọrụ ugbo ma na-esonyesi ike  na ya, tụmadụ iji bụrụ ndị kwụụrụ onwe ha na ndị ofe zùùrù nri, ma n’ime oge a ọrịa korona na-ewù, nakwa oge ọ dajụrụ.

Dịka ọ na-echetara ndị ntorobịa na oge agakwaala mgbe a na-ahụta ọrụ ugbo dịka ihe dịịrị naanị ndị okenye, ndị agụghị akwụkwọ maọbụ ndị amaghị nke ekwe na-akụ; Maazị Ibida kọwara ọrụ ugbo dịka ihe bara oke uru, n’ihi na ọbụghị naanị na ọ ga-eme ka onye na-akọ ya nwee ego, kama, ọ ga-emekwa ka onye ahụ na-enwe nri gbaanyụụ, maka na mmiri anaghị akọ n’isi mmiri. 

Ọ kpọpụtasịkwara ụfọdụ ụzọ dị iche iche Gọvanọ Obianọ sigoro nwògharịa ngalaba ọrụ ugbo steeti ahụ ka ọ na-amịzị akpịrị, ma kpọkuzie ọhaneze ndị Anambra ka ha were ohere ọma ahụ kpọrọ ihe ugbua, maka na ọ naghị adị mma ịnọ n’ikpo nri na-ebe akwa agụụ.

Leave a Reply