Mmemme

Ịgba Afa

Si n’aka: Izunna Okafor

 

 

Ndị Igbo nwere ọtụtụ nkwenye dị iche iche, bụ ihe ha jidesiri aka ike, ma bụrụkwa nke sitere n’aka ndị nna nna anyị wee rute anya aka. Nkwenye ndị a abụghị naanị na ha sitere n’aka nna nna anyị ha wee rute anyị aka, kama, ha na-apụtakwa ìhè ma na-emezùpụtakwa emezupụta dịka a tụrụ anya.

Ndị Igbo, ọkachasị na mgbe gboo, nwere otu usoro pụtakarịchara ìhè ha si achọpụta ihe mere eme, ihe na-eme eme, ihe ga-eme eme, na ihe bụ eziokwu, ya na ụzọ ha si achọpụta maọbụ na-ahụ ihe nzuzo ọbụla mmadụ dị ndụ apụghị ịchọpụta maọbụ hụ site n’anya nikịtị dịka mmadụ nkịtị. Otu usoro ahụ bụ ịgba afa, maọbụ ịjụ èsè (àsè), dịka ndị si akpọ ya.
Ọ bụ usoro ndị mmadụ si achọpụta echiche ndị mmụọ ma na-ajụpụtakwa ndị mmụọ ihe ụfọdụ dị omimi. Ọ bụ onye dị ndụ na-agba afa, mana ọ bụghị onye ọbụla dị ndụ na-agba afa, maka na e kere ọrụ eke. Ya bụ na ọ bụghị onye ọbụla chọrọ ịgba afa ga-agbanwu afa, maka na mmanwụ ọbụla mà obom ruru ya. Ịgba afa dịịrị dibịa, mana ọ bụghịkwa dibịa niile nwèrè ike ịgba afa, maka na ihe ụwa si n’akaraka.
Ọ bụzị onye nwere ike ịgba afa?
Ịgba afa dịịrị naanị ndị a na-akpọ dibịa afa. Dibịa afa bụ dibịa kara aka, ma bụrụkwa dibịa nwere onyinye ịhụ/ịchọpụta ihe dị omimi, maọbụ ịjụpụta ebumnobi ndị mmụọ, maka na ọ na-abụ oke dibịa nyụọ ahụrụ, ọha mmụọ na ọha mmadụ anọ isi ya. Ya bụ na dibịa afa na-ahụ n’ìhè, na-ahụkwa na mmụọ, nke mezịrị ụfọdụ ji akpọ ha ọkara mmadụ, ọkara mmụọ.
N’ebe ụfọdụ, ọ bụ ndị a maara dịka eze mmụọ, maọbụ onye na-efe/na-echukwa arụsị obodo ha na-agba afa, n’ihi na ọ bụ site n’okwu arụsị ahụ ka ya na ndị mbụ na ndị ègèdè (bụ ndị nna nna ha lagoro mmụọ) na-akparịta ụka, o wee na-ajụtakwa ha èse bànyere ihe dị iche iche na-emegasị n’obodo.
Afa bụ otu, mana afa dịkwa n’iche n’iche, dịka ndị gara ịgba afa ahụ maọbụ ihe e jiri gaba ịgba afa ahụ siri dị. Ụfọdụ afa dị iche iche e nwere gụnyere: afa obodo (ya bụ, afa ndị obodo gara gbaa bànyere ihe metụtara maọbụ ihe na-eme n’obodo), afa ezinụlọ (ya bụ afa ndị ezinụlọ gara gbaa bànyere ihe metụtara maọbụ ihe na-eme n’ezinụlọ ahụ), afa onwe (ya bụ, afa mmadụ gara gbaa n’isi onwe ya banyere ihe na-eme na ndụ ya maọbụ ihe metụtara ya), afa agụ (ya bụ afa a gbaara mmadụ, ọkachasị ụmụaka, iji chọpụta onye lọrọ ha ụwa), tinyere ụfọdụ afa ndị ọzọ.
Mmadụ ọ ga-anọkatadị gaba na nke dibịa ịga gbaa afa?Mba! maka na mkpa dibịa anaghị akpà onye ahụ dị. Mmadụ anaghị anọgide ghụba eze ma ọ bụrụ na o nweghị ihe fara ya n’eze, maka na onye enweghị ala anaghị achọ ókè ala ya. Ya bụ na ọ bụ ihe na-akpata ihe, maka na e jighị anya ọma eje ụka ekpere. N’ịdabere na nke ahụ, e nwegasịrị ụfọdụ ọnọdụ dị iche iche nwere ike ime ka mmadụ maọbụ ndị obodo bilie ịga agba afa.Ihe ndị a gụnyere: ọnwụ ike maọbụ oke ọnwụ, ọnọdụ amụghị nwa, ụkọ mmiri ozuzo, ọrịa ọjọọ, aka nkụchasị maọbụ ọnọdụ agaghị n’ihu, ịchọpụta onye lọrọ mmadụ ụwa, oge a na-achọ ịlụ nwaanyị/di, oge a na-achọ maọbụ na-akwado ịga agha, isi mgbaka maọbụ ịpụ ara mberede, oke agụụ maọbụ oke ụnwụ ịdị n’obodo, anụ dị añaa ịbịakarị n’ụlọ mmadụ, nrọ dị àñaa, tinyere ụfọdụ ihe ndị ọzọ.
A gbaghị aka nkịtị were agba afa, maka a gbaghị aka ahụ nwata eze n’ọnụ. Ụfọdụ ihe dị iche iche e ji agba afa n’ala Igbo gụnyere ọjị, nzu, ego ayọrọ, ọfọ, ọmụ nkwụ, ugbene ọkụkọ, ogene, mkpụrụ òkwè, uriòm (nwa ọkụkọ), okpokoro mbe, mkpụrụ akwụ, tinyere ụfọdụ ihe ndị ọzọ, dịka ụdị afa a na-agba siri dị maọbụkwanụ onye na-agba ya bụ afa.
E nwere ọtụtụ uru dị iche iche dị n’ịgba afa, mana mkpokọta ha niile bụ na ọ na-eme ka mmadụ mara maọbụ ghọta ihe dị omimi, na-eme ka a chọpụta ihe bụ eziokwu, na-eme ka mmadụ nwee mgbazi maọbụ na-agbaso ezi ụzọ kacha mma, ma na-ewetakwa ụsa nye nsogbu dị añaa. 
N’agbanyeghị ọtụtụ uru dị iche, e nwere ụfọdụ ọghọm na-esi n’ịgba afa apụta. Afa na-agharịpụ mmadụ oge ụfọdụ, ọkachasị ọ bụrụ na a gbataghị ya, maka na ọkụkọ nwata gburu agbághị anụ, ọ gbáá ọkpụkpụ. Ụfọdụ ndị dibịa arụrụala na-anakwazị aka azụ ma jiri ịgba afa na-akpa ego, nke mezịrị ka ụfọdụ n’ime ha na-agba afa ụgha, ma na-atụkpò ndị mmụọ asị, na-ekwu ma nke mmụọ gwara ha ma nke mmụọ agwaghị ha. 
Mana ọ bụrụ mgbe gboo bụ oge elu bụ ala ọsa na oge ezi dị n’ukwu ụkwa, ndị mmụọ na-etichi ụfọdụ ndị dibịa arụrụala dị etu ahụ ọnụ, maọbụkwanụ gbuo ha egbuo. Ọ bụ nke a mere na e nwekebeghị ndị  dibịa afa na-agba afa ụgha oge ahụ, maka na ọ bụ naanị ojoko hụchaara ka e gburu nwanne ya maka na ọ mịrị amị, ma kachie ntị ga mịkwa nke ya. Ohi, mpụ, arụrụala, ịkpa nsi, ọnwụ ike na ọtụtụ ihe ọjọọ ndị ọzọ jupụtara ebe niile ugbua adịkebeghị n’oge ahụ, maka na ụdịrị ihe ahụ mee, a gaghị egbu oge chaa chaa, a ga gbaa afa ma chọpụta onye maọbụ ndị mere ya, gbuo maọbụ nye ha ntaramahụ kwesiri ha, dịka ihe ha mere siri dị; ndị ọzọ amụrụ akọ ozigbo, ma tụọ egwu ime ihe dị etu ahụ.
Ịgba afa mara mma nke ukwuu ma bụrụkwa ihe kwesiri ka e tute ma jigidesie ya ike nke ọma ka ọ ghara ịnwụ, ọkachasị ugbua ndị ụka ekpere adịgboloja juzịrị ebe niile. Ndị Igbo sị na ọ bụ ndị okenye nwụchaara, ụmụaka nwerezie ịkpọ ìkìrì. Nke ahụ wee bụrụ eziokwu, ma e lee anya n’ihe ndị amụma ụgha jizị mmadụ eme ugbua, ụdị ego ha ji ụmụ mmadụ akpa, nakwa etu ha si etisà ọtụtụ ezinụlọ dị iche iche site n’ibu amụma ụgha ha maọbụ ịfụ ọfụ anyamkpọ ha.
Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị mmadụ, ọkachasị ndị ji ụka wee hiri isi, ekwenyeghị n’ịgba afa, n’ihi na ọtụtụ n’ime ha na-ahụta ya dịka ihe ikpere arụsị, ebe ọtụtụ n’ime ha na-asịkwa na okwukwe ha megidere ya, mana ha gaa ha esi n’azụ dunye mmadụ maọbụ were ụkwụ ha ga jụchara obere èsè banyere ihe ụfọdụ metụtara ha; ụwa ana-agakwarị.
Ndị Igbo, ka anyị tetanụ n’ụra, ma jidesie ihe nna nna anyị ha nyefèrè anyị n’aka ike ka o were ghara ịwụ maọbụ ifunahị anyị, maka na ndị ahụ buru anyị ụzọ gbaa ọsọ ndụ a, ghọtara uru ihe ndị ahụ bara. Ọbụladị n’akwụkwọ nsọ, a jụrụ èsè ma gbakwa afa. Nke anyị ọ ga-adịzị ichè.Ịgba afa mara mma, ịgba afa ga-adị, njirimara na ọdịnala Igbo ga-adịkwa.Igbo ga-adị.

Leave a Reply