Akụkọ Ụwa

Ndị Abacha Ekwupụtala Obi Ha Banyere Igwe Ha A Chụrụ Achụ

Si n’aka: Izunna Okafor, Awka, Nigeria
 

Ndị obodo Abacha dị n’okpuru ọchịchị Idemili North nke steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee mee ịkpọ ganị-ganị n’ụzọ udo, banyere ọchụchụ ahụ gọọmenti steeti ahụ chụrụ eze ọdịnala ha bụ Igwe Godwin Ben Chuba Mbakwe.Ịkpọ ganị-ganị ahụ bụ nke ndị ahụ malitere na mpaghara ebe dị iche iche n’obodo ahụ, ma bụrụkwa nke ha meere wee gaa n’obi gọọmenti steeti ahụ dị n’Awka, bụ ebe ha nọrọ wee chịkọta ya.
Ndị ahụ bugasịkwa akwụkwọ e dere ihe dị iche iche na ya wee mee ịkpọ ganị-ganị ahụ, nke gụnyere: “Abacha bụ obodo udo”, “Anyị kwụ gọọmenti Anambra n’azụ”, “Anyị katọrọ ihe Igwe GBC Mbakwe mere”, “Abacha na Obianọ dị n’udo”, “Anyị jụrụ ọchịchị aka ntagide Igwe GBC Mbakwe”, tinyere ụfọdụ ederede ndị ọzọ dị etu ahụ.
N’ikwupụta ọnọdụ ha dịka ndị obodo Abacha, onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ Maazị Ifeanyi Okeke  mere ka a mara na ọchịchị Gọvanọ Willie Obianọ emeerela obodo ahụ ọtụtụ ihe dị iche iche, ma rụkwara ha ọrụ mmepe dị iche iche kemgbe ọ batara n’ọkwa ọchịchị. Ọ katọkwazịrị ihe ahụ eze ọdịnala ha bụ Igwe Mbakwe mere, bụ iso bagide na njem ịga Abụja ịhụ onyeisi ala Nigeria bụ Muhammadu Buharị n’agwaghị maọbụ buru ụzọ nata nkwàdo n’aka Gọvanọ; ma kọwazie ya bụ akparamagwa dịka ihe ihere na ihe ichu aha nyere obodo ahụ. Ọ kọwakwara nke ahụ dịka ịgba ọchịchị steeti ahụ mgba okpuru.
N’okwu ya banyere nke ahụ, otu onye e ji okwu ya agba izu n’obodo ahụ, bụ Maazị Nelson Olife mere ka ha mara na obodo ahụ kwụ gọọmenti steeti ahụ n’azụ n’ihe ọbụla ọ na-eme iji mee ka ndị ji ọkwa ọchịchị na-akwanyere onwe ha ùgwù ma gharazie ite onwe ha ure maọbụ ịkpụtọ ùgwù dịịrị ọkwa chịchị ha.Ndị obodo ahụ mechààrà wee nye gọọmenti steeti ahụ akwụkwọ ozi banyere ọnọdụ ha n’ọchụchụ ahụ ọ chụrụ eze ọdịnala obodo ha.
Na nzaghachi ya, onye ndụmọdụ pụrụ iche nyegara Gọvanọ Obianọ n’ihe gbasaara echichi ọdịnala na ọchịchị obodo, bụ Oriakụ Vera Okechukwu gbara akaebe n’eziokwu na Abacha bụ obodo udo, ma kwezie nkwà na ọ ga-eme ka ozi ha ruo gọọmenti steeti ahụ aka.
Ọ dị ncheta na Gọvanọ Willie Obianọ nọrọ n’abalị iri na otu nke ọnwa Ọgọstụ wee chụtuo ndị ọeze ọdịnala obodo iri na otu n’ọkwa, maka ịsoro otu ọgaranya gaa Abụja ịhụ onyeisi ala Nigeria n’enwetaghị nkwàdo site n’aka ọchịchị steeti ahụ.

Leave a Reply