Izunna OkaforMmemme

Ịgụ Aha n’Ala Igbo

Ịgụ Aha n’ala Igbo pụtara inye mmadụ, ọ kachasị nwata a mụrụ ọhụụ ahà, ma ọ bụ ịbà ahà, dịka ndị si asụ. Aha bụ njirimara onye ma bụrụkwa ihe onye na-aza. Onye ọbụla na ihe ọbụla dị n’ụwa nwere aha e jiri mara ya, ma ndị nwụrụ anwụ ma ndị dị ndụ; maka na onye enweghị aha nọ ọdụ ka oke osisi enweghị akwụkwọ. Ọbụnadị ụmụaka a mụrụ ọhụụ na ụfọdụ ndị a ka bù n’afọ nwechakwuru aha.


N’ala Igbo, ọ bụrụ mgbe elu bụ ala ọsa na mgbe ezi dị n’ukwu ụkwa, bụ oge gboo; ọ na-abụ nwaanyị tụrụ ime, nwoke atụrụ echiche, ọ kachasị ọ bụrụ nwoke ọnọdụ dịịrị añáā. Echiche nke a abụghị naanị maka ihe a ga-eri, ihe a ga-eji zụọ nwa, maọbụ ihe nwaanyị na afọ ime ya ga-eje; kama otu ihe ọ na-echèkarị n’oge ahụ gụnyere echiche bànyere aha a ga-enye nwata ọhụụ ahụ ma o sepute isi n’afọ nne ya. Ọ tụlee nke a ga-enye ya ma ọ bụrụ nwoke, ọ tụlee nke a ga-enye ya ma ọ bụrụ nwaanyị, maka na o nwebeghị onye maara ihe ya bụ mbekwu gara afọ ga-azụta. 


Ihe e ji ebido na gboo wee chebe echiche aha ahụ abụghị na nne na nna nwata ahụ apụghị inye ya aha ọbụla gbatara ha n’uche; kama ọ bụ maka ihi na ndị gboo ghọtara úrù àkpà agwụ bààrà ézè dibịa ma ghọtakwa úrù ọkpọntụ baara ụgụrụ.
Ha ghọtara n’ezie na ọ bụ aha onye na-edu ya, maka na ọ bụ ihe onye kpọrọ nwa nkịta ya ka ọ na-aza ya. Ndị Igbo na mgbe gboo ma úrù ezi aha bara na ndụ mmadụ ọbụla, ihe aha onye pụtara, nakwa ihe aha onye pụrụ ibutere ya ma ọ bụ igbochiri ya n’ụwa ya. Ọ bụ ya mere ha ji echemì echiche ime, ma takwa okwu eze tupuu ha agụọ nwata ọbụla aha, ka aha ha gụrụ ya wee ghara iwetara ya ‘ịmakwara me m eze ka ewu’ maọbụ bụrụ ihe ọgbatuhie nye ya na ndụ ya.


Echiche na amamihe na-ejuputakwa n’aha ndị Igbo gụrụ mmadụ n’oge gboo ahụ maka na ha na-elechaa anya n’ihe mere na ndụ onye ahụ, ọkachasị mgbe a dị ime ya; ihe mere na ndụ nne ma ọ bụ nna ya; ọnọdụ nwata ahụ n’ezinaụlọ ahụ, ihe a na-atụ anya ya n’aka ya; oge ma ọ bụ ụbọchị a mụrụ ya, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ ha na-elekwasịkarị anya tupuu ha enye ya bụ nwata aha.


N’ụbọchị ahụ a ga-agụ nwata ahụ aha kpọnkwem, ihe mkpori na-ezo ka mmiri maka na a ga-eri ma ñụọọ gwòògwòò. Ndị ezinaụlọ ahụ na-ezikwa ndị mmadụ ka ha bịa nọnyere ha ụbọchị ahụ, rie ma ñụọrọ, maka na òkù nwa enweghị iro. Ihe ndị a bụchannọọ nke na-egosi na a kwadòro ya bụ ụbọchị nke ọma. Nke kacha nke bụ na a na-ekpekwa ekpere ụbọchị ahụ kelee Chukwu Abịama n’isi nwa bịara ụwa, ma rịọkwazie ya ka o mee ka aha nwata ahụ ghara ịbụrụ ya ihe ọgbatauhie n’ụdị ọbụla; kama, ka o si n’elu si n’ala wetere ya chi ọma.


Nne na nna ga-eweputa aha izugbe a ga aba nwata ahụ, bụ nke onye ọbụla ga-eji mara ya. E nyechaa ya nke ahụ, nneochie, nnaochie, nnukwu nne na nnukwu nna (n’ótù n’ótù) na-ewetakwa aha a ga-enyere ha nwata ahụ, bụ aha nke ha onwe ha ga na-akpọ ya. Onye ọbụla n’ime ha na-enyekwa nwata ahụ oke nkwụ ma ọ bụ nnukwu oke ọkụkọ, iji goro aha ahụ ọ chọrọ ịdị na-akpọ ya.


Dịka e si eme n’ebe ụfọdụ n’ala Igbo, a ga-akụkwa otu osisi n’aha nwata ahụ ụbọchị ahụ, dịka osisi ugoro, akwụ, akị oyibo, ube, ụkwa maọbụ osisi ọbụla ọzọ dị mma. Nke ahụ ga-abụ osisi álā nwata ahụ malite n’ụbọchị ahụ. Iji maa atụ, ọ bụrụ akwụ, a ga-asị na ọ bụ akwụ álā nwata ahụ. Ọ bụkwa ya ga-enwerezị akwụ ahụ malite n’ụbọchị ahụ. Ya ga ewegidekwa ihe ọbụla mịrị na ya, ma o buo, rukwaa ụbọchị ọ nwụrụ. Ọ bụrụ na a chọghị ịkụ osisi, a ga-akpọkwasị otu osisi aha n’ụbọchị ahụ n’aha nwata ahụ, o wee sikwa otu ahụ bụrụ nke ya malite oge ahụ.
Ihe ndị a bụ otu e si eme ya bụ emume ịgụ aha n’oge gboo. Ọ bụ ihe jọgburu udele na njọ ma sigbuokwa nkakwụ n’isi, ka ihe ndị a e jiri mara anyị bụ ndị Igbo sizị anwụnyụ anya ma na-efunahịzịkwa anyị bụ ndị Igbo. Ihe ndị ahụ niile bụzịkwa ihe anyị na-akpọdo isi n’ala ugbua, wee na-emezị omenelu, chèé na anyị so n’egwú. A sị na ọ na-abụ onye ghara ikwe, ọ sụọ n’ala, maka na ọ na-abụ ụkpala na-ere ọkụ, o chee na ọ na-aha mmanụ.


Ndị Igbo ọgbara ọhụụ ugbua na-emegharazị ihe ihu. A naghịkwa emekebe emume ịgụ aha maọbụ ịbà aha n’ala Igbo ugbua, ma ya fọdụzie inye nwata ahụ aha uche na amalihe dị n’ime ya. Ihe a na-amàzị aka ya ugbua bụ onye aha nwa nke nwa ya ga-akacha wee pụọ ichè maọbụ wee da ụda na ntị.
Onye ọbụla na-achọzịkwa ka nwa ya zaa aha onye ọcha, nke ọtụtụ n’ime ha enweghị ike ịkọwa ihe ọ pụtara ma a sị ha kọwaa. Ọtụtụ ndị Igbo wee na-abàzị ụmụaka aha inyo, aha nkịta, aha nri, aha obodo, nakwa ọtụtụ aha ndị ọzọ uche na-adịghị n’ime ya; naanị ka e wee sị na nwa ya na-aza aha oyibo, aha onye ọcha maọbụ aha pụtara ọhụụ.


A bachazie nwata aha nzuzu ndị a, ọ na-ezuzugharịzị, na-akpọkwùgharị maọbụ na-ekwukwùgharị dịka aha a kpọrọ ya siri dị; maka na ọ bụ ihe onye kpọrọ nwa nkịta ya ka ọ ga-aza. A naghị agharakwa n’ikwe sụọ n’ala ghara ịsụta aja. Ndị Igbo anaghịzị eji asụsụ Igbo aba ụmụ ha aha maọbụ nye ụmụ ha aha Igbo gbakwasịrị ụkwụ n’ihe mere na ndụ onye ahụ maọbụ ọnọdụ ya na ihe gbasaara ọdịnihu ya.
N’oge gboo, ị ga-anụ aha dịka: Chijindụm, Chizaram, Anọchie, Okeke, Okafọ, Nwankwọ, Nwaanyịafọ, Chimziterem, Nnabụugwu, Chikamso, Mmadụabụchukwu, Chinenyenwa, Nkiruka, Ọdịnakachukwu, Ahamefuna, Ndidimaka, Chinụalụmọgụ, Chikwuorom, nakwa ọtụtụ ọmarịcha aha ndị ọzọ dị otu ahụ.


Mana oge ugbua, naanị ihe a na-ahụzị bụ: ‘Chi-boy’, ‘Ebony’, ‘Martin’, ‘Robinson’ ‘ Nancy ‘Jefferson’ ‘Robertson’, ‘Nancy’ ‘Bridget’ ‘Jennifer’ Priscilla, Princess, Rachael, Tina, Cynthia, nakwa ọtụtụ aha ndị ọzọ dị otu ahụ, bụ nke na-enweghị ihe ọbụla ọ pụtara, na-abụghị naanị maka na ndị ọcha na-aza ya dịka aha. Nnyocha na-akọwa na ọtụtụ n’ime ahụ ahụ a na-enyezị ụmụaka ugbua bụzị aha nkịta ndị ọcha na-aza; anyị wee ñòmiri ya. A na-ekwu na ọrịa ezughị okè, onye ịba a na-etokwu afọ. Onye sị ka a kpụọ ya isi a kpụrụ nwa Mgbeke, ọ makwa na isi ya na nwa Mgbeke abụghị otù?


Ndị be anyị, ọ bụ ihe ọbụla anyị hụrụ ndị ọcha na-eme ka anyị ga-eñòmi, mụrụ maọbụ sokwa ha mebe? Ha onwe ha ọ na-asọkwa nsọ ịmụrụ nke anyị laa na be ha ga mebe? Ka ọ bụ sọ mmụrụ ka anyị na-amụrụ?? Anyị chọchakwa ihe ndị anyị ga-amụrụ n’aka ha, ọ bụrụ ndị enweghị uru ọbụla ọ ga-abara anyị?


Doo ndị Igbo be anyị, ka anyị laghachinụ azụ n’ebe anyị si, bụ ihe ndị ahụ e jiri mara anyị n’oge mbụ, ka nke anyị wee dịrị anyị. Ọbụladị ụmụagbọghọ anyị ndị na-akpachapụ anya jiri aka ha gbanwee ezigbo aha ọma Igbo nne na nna ha nyere ha, ma zabazie aha ndị ọcha, sị na nke Igbo ahụ na-eme ha ihere; doonụ ka onye ọbụla selata aka ma sepu mma na akịdị maka na e jighị mma eri akịdị. Onye tụfuru aha ya nọkwa ọdụ ka onye bara kọrọ n’isi. Onye kpọọ ọba ya ọkpọkọrọ, agbatobi ewere ya kpoo ntụ. Onye a gwara kwe, a hụ ọzọ, a gwakwa ya. Mana onye agwara agwa ma ọ nụghị anụ, o mee emee, ọ hụ ahụ; maka na nwata a na-akpọ oku n’ụlọ ọ na-agbakpu ọhịa ga-emechakwaa mara na ọhịa abụghị ebe oboibi.
Ndị Igbo nyebenụ ụmụ ụnụ aha Igbo na aha uche dị n’ime ya, maka na nke ahụ ga-enyekwa aka n’ụzọ pụrụ iche n’ịkwalite asụsụ Igbo.
Asụsụ na omenala Igbo ga-adịrịrị.

Si nʻaka Izunna Okafor nʻỌka, Naijirịa.

Leave a Reply