AhụikeEdemede

Njekoro (Coronavirus)

NJEKORO (CORONAVIRUS)

GỊNỊ BỤ NJEKORO?
Njekoro bụ nje a hụrụ n’ime anụmanụ, nke nwere ike ibanye na mmadụ site n’anụmanụ. Ọ na-esikwa na mmadụ banye na mmadụ.

Njekoro nwere ike ibute ọrịa dị icheiche dịka oyi nkịtị, Nnukwu Ọdọọrịa Akụkụ Okukuume (SARS), Ọdọọrịa Okukuume nke Etiti Ọwụwaanyanwụ (MERS). N’afọ iri abụọ na iri na iteghete (2019), njekoro ọhụrụ pụtara na mba Chaịna.

MGBAÀMÀ NJEKORO
(1) Ahụ ọkụ ruru 100.4°F (38°C).
(2) Ụkwara.
(3) Ihe isi ike n’iku ume.
(4) Ike ọgwụgwụ.
(5) Ahụ mgbu.
(6) Azụzụ.
(7) Ọrịa akpịrị.
(8) Oyi baa.

IHE NA-EBUTE ỌRỊA NJEKORO
A na-ebu ụzọ enwete njekoro site na mmekọrịta mmadụ na anụmanụ. O were si ebe ahụ gbasaa site na mmadụ banye mmadụ ọzọ. Ndị ọrụ ahụike amatabeghi anụmanụ kpatara ọrịa njekoro (COVID-19).

COVID-19 nwere ike ịgbasa site na mmekọrịta mmiri ahụ, dịka ụmụ irighiri mmiri dị n’ime ụkwara. Ọ nwere ike ịgbasa site n’ịmetụ ihe onye nwere ya metụrụ aka wee metụ ọnụ, imi, na anya gị aka.

NHỊKỌSỊ NJEKORO
(1) Oyi baa.
(2) Ịda mbà ọgan mmadụ.
(3) Ọnwụ.

KEDỤ KA E SI ACHỌPỤTA NJEKORO?
Ị maara na ị nwere mgbaàmà nke njekoro, gawa ụlọọgwụ gaa hụ dọkịta gị. Dọkịta gị ga-enyocha gị, ọ ga-agwa gị ka ị nọpụ iche, nọrọ n’ime ụlọ gị naanị gị.

E NWERE IKE IGBOCHI NJEKORO?
Ee, mee ihe ndị a Iji gbochie njekoro:
(1) Zere ndị ọrịa.
(2) Zere nzukọ na ọgbakọ ọtụtụ ndị mmadụ.
(3) Mechie ọnụ gị oge ị chọrọ ịkwa ụkwara.
(4) Sacha aka gị nke ọma oge niile.
(5) Zere imetụ aka gị na ọnụ, imi na anya gị.
(6) Zere ịnọ ndị ọrịa nso.
(7) Debe ebe ọbụla ị na-emetụ aka ọcha.
(8) Nọdụ n’ụlọ ma ọ bụrụ na ị na-arịa ọrịa, naanị ma ị na-eje ụlọọgwụ.
(9) Zere iri anụ ndụ maọbụ anụ na-egheghi eghe.
(10) Zere ụmụ anụmanụ.

ỌGWỤGWỌ NJEKORO
O nweghị ọgwụ mgbochi ọrịa maọbụ ọgwụ ọgwụgwọ njekoro. Mgbaàmà njekoro na-eji aka ha laa. Dọkịta nwereike inye gị ọgwụ ahụ. Ňụọ nnukwu mmiri; zuo ezigbo ike.

IHE IZE NDỤ NKE NJEKORO
(1) I mee njem gaa n’obodo ndị nwere njekoro.
(2) Mmekọrịta nso gị na onye nwere njekoro.

Dọkịta Nnamdi Achuko

Site n’aka:
Dọkịta NNAMDỊ ACHỤKỌ
Onyeisi Ngalaba Anya n’ụlọọgwụ *General Hospital, Kafanchan, Kaduna State, Nigeria,”

Akara Ekwentị:
08035830985

Leave a Reply