Akụkọ ỤwaIzunna Okafor

Ọba Akwụkwọ Emeela Ụbọchị Mmụta Na Mba Ụwa

A kọwaala agụmakwụkwọ dịka onyinye kacha mma mmadụ kwesiri inye nwatakịrị ọbụla; ma mekwa ka a mara na ọnụọgụgụ ụmụaka anaghị agụ akwụkwọ taa na Nigeria gafèrè ndè iri na atọ.
Nke a bụ nke e kwupụtara site n’ọnụ  onyeisi isingalaba ọmụmụ ihe ‘Social Sciences’ nke mahadum Nnamdị Azikiwe dị n’Awka, bụ Ọkammụta Stella Ọkụnna, n’okwu ya na mmemme ncheta ụbọchị mmụta na mba ụwa nke ahọ 2020, bụ nke a haziri site n’aka ọba akwụkwọ steeti Anambra, na njikọaka ụlọọrụ ‘Nigerian Book Foundation (NBF)’ 
O mere ka a mara na onye ọbụla amaghị asụ maọbụ ede asụsụ ya bụ ìtìbọrịbọ, n’agbanyeghị ogoogo onye ahụ nọ n’agụmakwụkwọ maọbụ etu onye ahụ si asụ oyibo. Ọ kwàrà arịrị na ọtụtụ ndị Igbo anaghịzị asụ asụsụ Igbo ugbua, ma ya fọdụzie ịma etu e si agụ maọbụ na-ede ihe n’Igbo, n’ihi na onye ọbụla na-asụzị sụpịrị sụpịrị.
O chètààrà ndị Igbo na òtù mba ụwa UNESCO ebuola amụma na asụsụ Igbo ga-anwụ kpamkpam maọbụ funyụọ anya n’ahọ 2050; ya bụ n’ime ahọ iri atọ na-abịa abịa. Ọ kpọkuzịrị ndị mmadụ, ọkachasị ndị nne na nna ka ha na-akụziri ụmụ ha asụsụ na omenala Igbo; ma nyekwa ụmụ na-eto eto ndụmọdụ ka ha mụọ etu esi asụ, na-ede ma na-agụ ihe n’asụsụ Igbo, iji hụ na amụmá ahụ ndị UNESCO buru abịaghị na mmezu.
Na mbụ n’okwu ya, onyeisi ọba akwụkwọ steeti Anambra, kọwara ka ebumnobi mmemme ahụ bụ iji kwàlite mmụta ma chụọ ụbịam ọsọ ụkwụ eru ala, n’ihi na itibọrịbọ na-adọghachi aka elekere azụ n’ebe mmepe dị.
N’igbakwasa ụkwụ n’isiokwu mmemme ahụ nke ahọ a, bụ “Nkụzi na Ọmụmụ n’Ime Oge Ọrịa COVID-19 Ma n’Ọdịnihu”; Dọkịta Udeze rụtụrụ aka n’etu ọnọdụ nkụzi na mmụta siri gbata kwụrụ na mba ụwa ugbua ọrịa korona na-enye nsogbu, ma mezie ka a mara na ọnọdụ na usoro mmụta agbanwèéla ugbua, maka na ihe niile na-agazịkwa n’ùsòrò dijitaalụ ugbua. Ọ kpọkuzịrị onye ọbụla ka ọ mụọ etu e si eme ihe n’usoro ọgbara ọhụụ bụ usoro ịntaneetị, iji wee soro n’ihe a na-eme, maka na ụgbọ na-aghàzịkwa onye ọbụla amaghị etu e si eji usoro ịntaneetị eme ihe ugbua.
Onyeisi oche na mmemme ahụ, bụ Dọkịta Uche Nnyagu nke mahadum Unizik kọwara mmụta na agụmakwụkwọ dịka ihe bara oke urù.
N’ozi ekele ya, onyeisi nlekọta ‘Nigerian Book Foundation (NBF)’ bụ Nneka Ibeanu kelèrè ndị dị iche iche bịara mmemme ahụ na ndị tụnyere ụtụ n’otu ụzọ maọbụ nke ọzọ, iji mee ka mmemme ahụ gaa siriri-wèrèrè, ọbụladị dịka o kwèrè nkwà na ha agaghị ada mbà n’ịkwalite ọnọdụ mmụta.
Ndị ọzọ kwuru okwu na mmemme ahụ gụnyèrè onyeisi òtù ‘Emeka Anyaoku Foundation’ bụ Nguzoro Oluchi; onye na-etinye ọnụ n’okwu banyere ihe na-emegasị n’obodo, bụ Maazị Dennis Ekemezie; onyeisi ngalaba nhazi n’ụlọọrụ ‘Nigerian Book Foundation (NBF)’, bụ Oriakụ Gloria Chukwurah, tinyere ụfọdụ ndị ọzọ.
A nọrọ na mmemme ahụ gụọ ihe ọgụgụ ma mekwa ihe ngosi dị iche iche, site n’aka òtù dị iche iche, nke gụnyere òtù jikọtara ndị na-ede akwụkwọ n’ala Nigeria, bụ ‘Society of Young Nigerian Writers’ (ngalab steeti Anambra), ụmụakwụkwọ mahadum Unizik, nakwa òtù ndị ọzọ dị iche iche.

Si nʻaka Izunna Okafor nʻỌka

Leave a Reply