Akụkọ ỤwaIzunna Okafor

Ndị Nteje Emee Ịlọ Mmụọ Nke Ahọ 2020

Igbo sị na omenala bụ ọbara n’ehu n’agbụrụ n’agbụrụ, ma bụrụkwa nwata tote o tokwuru.Ka ọ dị taa, ndị obodo Nteje Abọgụ, dị n’okpuru ọchịchị Oyi n’ime steeti Anambra emeela mmemme Ịlọ Mmụọ, bụ otu oke mmemme e jiri mara ya bụ obodo, ma bụrụkwa mmemme ịwa na iri ji ọhụụ nke eze ọdịnala obodo ahụ.
Oke mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’obi eze ọdịnala obodo Nteje, ma bụrụ nke dọtara ụkwụtụụkwụ ụmụafọ obodo ahụ, ma ndị nọ n’ụlọ ma ndị nọ n’ụzọ ijè, tinyere ndị ọrụ gọọmenti, ndị e ji okwu ha agba ìzù na steeti ahụ, ndị enyị, ikwu na ibe, ndị ọgọ, ndị nwadiala na ndị ọzọ na-echere ha ezi echichè, bụ ndị bịara ịnọnyere ha na isoro ha nwee ya bụ obi añụrị.
N’okwu ya na mmemme ahụ, eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Rowland Odegbo weliiri Eke kere ụwa aka elu maka onyinye ndụ na ụbara ngọzị ya n’isi ụmụafọ Nteje, Ndị Anambra, Ndị Igbo, na ụmụafọ ala Nigeria n’izugbe. Ọ gọrọ ọfọ ogologo ndụ, ihe akụakụ na ihe enwe, ya udo tọrọ atọ na ọganihu n’isi obodo ahụ na ụmụafọ ya niile, n’ebe na ebe onye anọna.
Igwe Odegbo kelèzịkwara aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ maka ezi ịgba mbọ ya n’inwòghàrị ngalaba niile nke steeti ahụ, ya na ọrụ mmepe dị iche iche ọ na-abàgide, ọkachasị n’ime-ime obodo, ma dụọ ya ka o jisie ike na nzọpụ ụkwụ dike ahụ ọ na-azọpụ, ọbụnadị dịka o kpèrè ka Chineke gaa n’ihu ịgbà ya ume n’iwètàrà ụmụafọ steeti ahụ ezi ọchịchị.
Oge ọ wachara ji ahụ kpọmkwem, o kwùwàzịkwàra ma mee ka ụmụafọ Nteje mara na ji ọhụụ etozuola oke ma dịkwa njikere maka oriri na ya bụ obodo.
Dịka e si eme ya na mbụ, ọtụtụ ndị dị iche iche bịara mmemme ahụ, jiri ihe onyinye dị iche iche wee tụọrọ Igwe Odegbò mmamma, nke a na-akpọkwa ibu ìhù.
Otu onye n’ime ndị buuru ya ìhù ahụ, ma bụrụkwa onyeisi ụlọ mgbasa ozi Anambra Broadcasting Service, bụ Nze Uche Nworah, onye duru ụfọdụ ndịisi nhazi ụlọ ọrụ ahụ wee gaa bụ mmemme, kọwapụtàrà mkpa ọ dị na a ga na-echekwa ma na-emesi omenala Igbo ike oge niile, iji mee ka o guzosie ma dịkwa ọkpụtọrọkpụ.
O mere ka ọ mara na ọ na-abụ ihe obi añụrị isonyèrè obodo maọbụ eze ọdịnala na-emerùbe mmemme dị otu ahụ, maka na gidigidi bụ ùgwù eze, tinyekwuoro na ya bụ eze ọdịnala, bụ Igwe Odegbo emeela ihe dị ukwu ma tụnyekwa ụtụ n’ọtụtụ ụzọ dị iche iche n’agamnihu nke ụlọ mgbasaozi ABS (dịka onyeisi òtù bọọdụ nlekọta ụlọọrụ ahụ). O kpekwazịrị ka Chineke gaa n’ihu ịgọzi na inye ya amamihe na ogologo ndụ n’elu ogologo ndụ.
Onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ Maazị Berneth Chinweze kọwara mmemme Ịlọ Mmụọ Nteje dịka omenala dịbara gboo n’obodo ahụ, ma bụrụkwa oge ha ji akwanyere ji ùgwù na oge ha ji ekele Chineke maka ahọ ọrụ gara aga na owuwe ihe ubì. 

Si n'aka Izunna Okafor, Awka, Nigeria
 

Leave a Reply