Akụkọ ỤwaIzunna Okafor

Ndị Owerre-Ezukala Eriela Ji Ọhụụ

Ji bụ eze ihe a kọrọ n’ubì, bụzị nke mere nfị Igbo n’ụwa gbaa gburugburu ji akwanyere ya ùgwù.
Ọ bụ n’ịgbaso ya bụ omenala dịbara gboo ka ndị obodo Owerre-Ezukala jiri nọrọ na nsonso a wee merùbe mmemme iri ji ọhụụ nke ha, nke ahọ 2020.
Ya bụ oke mmemme wèèrè ọnọdụ n’eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Timothy Ogbonnaya dị n’Ishishi Owerre-Ezukala n’okpuru ọchịchị ‘Orumba South’ nke steeti Anambra, ma bụrụkwa nke dọtara ndị eze ọdịnala obodo dị iche iche, ndịisi ụka, imirikiti ndị e ji okwu ha agba izu.
N’okwu ya oge ọ na-eme omenala ịwa ji ahụ kpọmkwem, Igwe Ogbonnaya kpere ekpere maka udo na ọganihu n’isi obodo ahụ, steeti Anambra, ụmụ Igbo, na ala Nigeria n’izugbe, ọbụnadị dịka o kèlèrè Chineke maka ogologo ndụ na ahụike ọ na-enye. Ọ kpọpụtasịrị úrù dị iche iche omenala iri ji ọhụụ na-eweta n’obodo, ma kpọkuo ndị Igbo ka ha jigidesie omenala ha ike, maka na ọ bụ ebe onye bì ka ọ na-awàchi.
O jikwara ohèrè ahụ wee kelee aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ maka ọrụ ọma na ọrụ mmepe dị iche iche ọ rụgoro n’ime steeti Anambra na n’obodo Owerre-Ezukala, ọkachasị ọmarịcha ụgbọala ọhụụ ahụ o kèsààrà ndị eze ọdịnala obodo niile dị na steeti ahụ, nke ya onwe ya sòrò kèta òkè ya. 
O kwuru na ụgbọala ọhụụ ahụ Gọvanọ gòrò site n’aka Innoson, ga-enyekwa aka ịgbà ụlọ mmepụta ụgbọala ahụ dị n’Anambra ume nke ukwuu. Ọ gakwazịrị n’ihu kwe nkwà na obodo ahụ agaghị ada mbà n’inye ọchịchị ya nkwàdo.
N’okwu nke ha n’ótù n’ótù na mmemme ahụ, nnukwu onye enyemaka pụrụ ichè nye Gọvanọ Obianọ, n’ihe gbasaara mmekọrịta okpuru ọchịchị obodo, bụ Maazị Raymond Onyegu, na onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ Maazị Anayo Emejue kọwara iri ji ọhụụ dịka ihe kwesiri nkwàdo, ọbụladị dịka ha kèlèkwàrà Gọvanọ Obianọ maka ọrụ ọma dị iche iche ọchịchị ya rụgoro, iji kwàlite mmepe ime-ime obodo dị iche iche. Ha rịọkwara ya ka o jisie ike n’ọrụ.
A nọrọ na ya bụ nnukwu mmemme wee buo ìhù (tụọ mmamma) nyégara ya bụ eze ọdịnala, site n’aka ndị enyị, ndị agbatobi obodo ahụ, ndị ọrụ ụka, na ndị ọzọ na-echere obodo ahụ ezi echiche, bụ ndị nyere ya onyinye dị iche iche.
Igbo sị na ọ na-abụ a gbakọọ e righị, ọ dị ka e jere ọgụ be ndị mmụọ; maka na ọbụladị n’ụzụ akwa, ire na-eburịrị mmanụ ala.
N’ịgbaso nke a, a nọkwara na ya bụ mmemme wee ñụsàá ma risàá oke oriri dị iche iche, ọkachasị ji ọhụụ, bụ nke a kwadoro n’ụdị dị iche iche, ma were ụtazị na mmanụ akwụ Nteje wee gbuo ya ichi, ya na mmanya ngwọ jụrụ oyi e jiri gbanyere ya ụgbọ nwamkpi.

Si nʻaka Izunna Okafor nʻỌka

Leave a Reply